Sponsored
Search
Navigation

MMEMME EJIJE IGBO 2011, N’AWKA.

EJIJE IGBO ADỊWALA UGBUA SITE N’ENYEMAKA NKE IGBO FILM FORUM (E si n’Ogene Ojemba Nuuspepa nke ọnwa Disemba 2011 weta nke a). -15/3/2012

 

Nke a bụ ihe a na-atụburi anya ya kamgbe Chukwu kechara Abraham na Sarah.  Ekele dịrị ndị niile aka ha dị na ya, na ndị niile si maọbụ ga-esi n’ụzọ dị iche iche were na-enye ejije Igbo, edemede Igbo na omenala Igbo nkwado ha.

 

  MMEMME EJIJE IGBO 2011, N’AWKA.

Emume a ji ekpere mbido nke Rev. Fada. Rich. N. Ekegbo kpere were malite.  Nkwa ofufe ala Nigeria (National Anthen) nke Christy Ezenkwu bụ onye ndu sotere, ebe emume ọjị nke onye Awka bụ Nwabụnnaya bụ onye ndu na ya, sonyere n’ihe ndị a e nwere ike ịsị na ọ bụ ha bụ ihe mmalite.

Okwu nnọnụ nke si n’aka onyeisi Igbo Film Forum, bụ maazi Harris Chukwuma, kọwara na na ndị ejịje nollywood adịla nkwadowe imepụta ejije Igbo. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ọ bụ ndị Igbo bụ ndị nọ n’ịsị Nollywood. Ọ makwara ọkwa maka etu ihe emume a ga-emi ụbọchị atọ ga-adị. Nwamadị a gwara anyị ka anyị were asụsụ Igbo kpọrọ ihe, ma na-asụ ya nke oma, ka asụsụ anyị ghara ifu.  Ka nke a gachara otu otu ndi egwu bịara gbaa egwu.

Maazị Pita Ejịọfọ gakwara n’ịhụ kọwapụta na mmiri na-eri asụsụ Igbo. Ọ kwọwara na ejije ndị e mere n’asụsụ Igbo, mgbe a tulekọrịta ya na asụsụ nke ndị ọzọ, bụ naanị otụ pasentị. O gosipụtakwara mwute ya etu ngalaba amụmamụ nke dị na mahadum dịgasị na ndịda ugwu njirimara ha bụ mmepụta ejije, si eji asụsụ oyibo ezịpụta ya ma na-edekwa projekt ha n’asụsụ oyibo.

Onye nnọchieanya onyeisi nkanauzụ na ihe mmepụta na steeti Anambra kọwara na asụsụ Igbo bụ otụ asụsụ nke ndị mmadụ, ndị gbara ala Igbo agbataaobi anaghị achọ ịsụ. Ọ kọwapụtakwara na gọọmentị steetị a eweputala ụbọchị Wednezdee ọbụla maka ịsụ Igbo n’ụlọọrụ niile dịgasị na steei a. Ọ gakwara n’ihu kwuo na Gọọmentị steetị a nwere ụzọ dịgasị iche iche o si akwado asụsụ anyị a bụ asụsụ Igbo. Otu n’ime ha bụ inye agụmakwụkwọ n’efu maka onye ọbụla chọrọ ime Igbo n’ụlọakwụkwọ mahadum. Ọ kwukwara na onye ọbụla na-enwighi Igbo n’ule nke a na-akpo WAEC apụghị inweta nnabata na mahadum nke nke Steeti a.

Maazị Chinwetalụ Agụ, (bụ otu onye n’ime ndị niile e ji imepụta ejije na Nollywood a maara amara), kọwapụtara na ọ bụ ya bụ onye mbụ mere “Agolition”  n’asụsụ Igbo na Nigeria. O kwuru na onye mbụ bụ onye rụpụtara ejije Igbo bụ Kenneth Nnebuo, nke bụ “Nek production”. Ejịje mbụ ha mepụtara bụ “living in bondage” nke ya onwe ya nyere aka kpụta Maazị Kenneth Okonkwo ka ọ bịa soro mepụta ya.  Ọ gakwara n’ihe kwuo na ọ bụ ndị oji ego achụ ego “business”, bụ ndị bịara tinye aka n’ihe ejije Igbo bụ ndị chọpụtara na ha tụgharịa ejije Igbo a, a sụwa ya n’oyibo, na ha ga-aka nweta ego. Ya mere e ji tụgharịa omenala anyị, na-emepụta ya ń ejije oyibo.

Ọ kọwakwara na ihe mere asụsụ Igbo ji anwụ anwụ bụ maka na ndị mmadụ anaghị achọ ka umụ ha mara ka e si asụ ma dee Igbo. O wutere na Ị ga-ahụ nwata Igbo, jụọ ya maka nne ya na nna ya, sụọrọ gị oyibo sị “am sorry, I didn’t grow up in Igbo land”. Ọ kọwara na nwada Chizọba, onye nke soro ha mee ejije a kpọrọ living in bondage” emepeela ebe mmepụta ihe onyoonyo (station) nke dị na ‘African Majic’ ebe a na-emepụta ihe ejije n’Igbo. Ọ kọwara na ya nara ya aka ma gbaa ya ume na ihe a o mere.

Ọ gakwara n’ihụ kwuo na pasentị iri-anọ na asaa ejije ndị a a na-eme  n’asụsụ bekee bụ ndị Igbo na-emepụta ha ma kọrukwaa na ihe kpatara ya bụ na nke bekee ka enye ego karia nke Igbo n’ihị na nke oyibo na-aga akụkụ ụwa niile mana nke Igbo agaghị agalị.    

Onye nnọchiteanya onye nlekọta ejije niile n’ala Nigeria bụ Emeka Mba, kọwara na o lere anya ka ya hụ ndị na-emepụta ejije ka ha bịara mana o wutere ya na ha abịaghị. O kwuru na mmadụ ekwesịghị ka ọ bụrụ sọ ihe na-enye mmadụ ego ka onye ahụ na-eme. Ọ rịọrọ arịrịọ ka ndị si steetị ise ndị a dị na ndịda ugwu ka ha zisaa ozi ka ndị isi steeti nyere aka ma kwado ejije Igbo a. Ọ kpekwara ekpere ka Chineke nyere onyisi ejije Igbo aka ka echiche a o chepụtara ghara ila n’iyi site na e mechaa nke a, agaghị eme ya ọzọ.  Onyeisi ejije Igbo bụ Harris Chụma kọwapụtakwara ọtụtụ ihe nsogbu o nwere n’ihe gbasara ikwado ọgbakọ a ma rịọkwaa anyị arịọrịọ ka anyị tinye onye nke ọ na-ele anya na ọ kwesịrị ịnọ ebe a, nke abịarubeghị n’ekpere.  Ọ gakwara n’ihu inye ndị e kwesịrị inye asambo site n’ịkpọpụta ha niile. (Ada Igbo) Nwada Chinyere Okpe kwadoro ejije Igbo site n’nye puku Naira abụọ.

Ndị ọtụ egwu ogene na Egwu ekpịlị ọbụla bidoro gbawa egwu tupu inye ọnyịnye ntosị ebido.

Ndị a bụ ndị e nyere onyinye ntọsi (Award) nke ndị Igbo na-ejere Igbo ozi, na-agbara Igbo mbọ, ma na-anọchitekwa anya ndị Igbo n’ebe niile nakwa na mba niile. Ha bụ ndị a:

Chika Chukwura (Ada Igbo)

Okammuta (prof.) Pita Ejiofor

Sir Ephriam . O. Ofoma

    Queen Kaneelechi Easther Kamah (USA)

     Uzor Nwosu (Gunnika)

    Hon . Emeka Anohu

     Dr. Chinwe Chukwuogo – Roy (UK)

     Austine Okafor (AUSTRIA)

     Don Nkem. C.

     Dr Mrs Uche Umeh (USA)

     Emeka Ike

     Comrade Jude Ezenwafor

     Prof. Clifford Nwanna

     Prof. Charles Nwadigwe

     Chief Obiora Ezumeza

     Dr. Tracie Utoh

     Suncity Ibitola (Remdel Opt. Com.)

     Dozie Ebo

     Azuh Arinze

     Kingsley Orji

     Ben Njoku

     Ndị ọzọ bụ ndị a:

     Dr Mrs Chinyere Okpe

     Chinwetalu Agu

     Sir Comas Ndulue

     Nneoma (AGN Imo State)

     Dr Prince Donatus Okonkwo

     Tefrazzini

     Toochukwu Mmegbuanaeze

     Kpakpando TV

     Nneoma Ukpabe

N’ụbọchị nke abụọ, Igbo Film Forum mere ihe ngosi na nkụzi maka ihe ejije na aka ọ ga enye na ịbulite omenala Igbo.

Nkuzi nke mbụ bụ Igbo language film: A vital tool for Cultural Expression (Ejije Igbo: Nnukwu ihe ga e bunyi omenala igbo), -Okammuta Clifford Nwanna, HOD, Fine and Applied Arts, Nnamdi Azikiwe University Awka, Anambra State.

Nke abọ b: Igbo Film Makers, Roles & Responsibility in CulturalReawakening Project of Ndị Igbo. (Ọrụ ndị na-eme ejije kwere na ịkwalite omenala ndị Igbo) -Ọkamnuta Charles Nwadigwe President, National Association of Theatre Arts practitioners, Anambra State.

Nke atọ b: Swakwa Igbo: A Renewed Struggle for the Revitalization of the Fallen Igbo Language.  -Ọkamnuta Pita Ejiofor onyisi otụ sụbakwa igbo initiative

 Nke Anọ bụ: Igbo Language Film: the rise, Fall and Resurrection. -Madụ C. Chikwendụ – Regional Secretary FEDRATION OF AFRICA, CINEASTE, FEPACI, DIRECTOR, LEAP INT’L FILM FESTIVAL (LIFF)

Nke ise bụ: Igbo Language Film, Employment & Investment Opportunity – Amayor Uzor Philip, Founder Omenigbo, ACE FILM MAKER.

 

                                 NDỊ NWERE AGBA NA NOLLYWOOD

N’ụbọchị nke atọ, ihe mmemme otu a bụ Igbo Film forum, tunyere nwada Obijeme Chidimma Ugo, n’ihi omume ya, asụsụ na egwu ya, tinyere ihe ndị ọzọ ọ zara, iji josị na ihe ime ejije n’Igbo dị ya n’ọbara..

Ọ bụ Eddy King, Ifeanyi Mbachu, bụ onyeisi ejije ngalaba nke Steetị Anambra (AGN Anambra branch) bụrụkwa onye isioche Nollywood, Igbo media Association (NIMA), kpụnyere Nwada a tuuru ugo na FACE film 2011 (IHU EJIJE 2011) okpu dika onye mbu na mbu. Nwaada merisịrị n’asọmpị ụmụagbọghọ ịrị na ịsịị.

 

 

 

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 0 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.