Sponsored
Search
Navigation

IHE M GA-ABỤ N’ỌDỊNỊHU

Edemede Nkọwa (Descriptive Essay).
Edemede a bụ nke otu obere nwaada gụchara kọleeji n’ụlọakwụkwọ ndị ụka Katọlliki dị na Nkwere, Awka, a na-akpọ St. Peter’s Catholic Church, bụ Chidimma Nwankwo dere. Ma ka o si dị, a họtara edemede a dịka nke kachasị mma n’ime edemede asọmpi niile ụlọakwụkwọ a chịkọwara ka ha mere mmemme mmechi afọ ụlọakwụkwọ ahụ n’ọnwa Disemba, 2013.
Gụrụ ya n’onwe gi.

IHE M GA-ABỤ N’ỌDỊNỊHU
-Chidimma Nwankwo
Rich. N. Ekegbo, [onye ndezi]

Ekele diri Chukwu onye mere ka m bụrụ nwata a mụpụtara n‘oge agụmakwụkwọ bụ ihe nwoke na nwaanyị ji anya isi. Ihe m jiri sị ka otito dịrị Chineke bụ na ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịbụ n’ọgbọ a ga-esirịrị n’agụmakwụkwọ nweta ya. Ọ bụ mmụta ga-eme ka mmadụ nwee ike ịhazi ma gosipụtakwa ọrụ ahụ nke ọma. E nwere ọtụtụ ihe bara uru mmadụ nwere ike ịbụ site na mmasị nke ya dịka dọkịnta, onye ọrụ ugbo, ịzụ ahịa, nkanụzụ, ode akwụkwọ, ịdụ na maọbụ ịkwa akwa, ịmụ ọrụ aka dị iche iche dgz. ihe niile ndị a dịchasị mma, mana ọ ga-amasị m ịbụ Ọkammụta asụsụ Igbo.
Tupu m gawa n’ihu ịkọwapụta ihe m jiri nwee mmasị ịbụ Ọkammụta asụsụ Igbo, ọ ga-amasị m ikọwapụta ihe Ọkammụta bụ n’ihi na a chọwa anya anụ, a gaa n’isi ya. Ọkammụta bụ onye nkụzi e nwere n’ụlọakwụkwọ dị elu. E nwere Ọkammụta na ngalaba agụmakwụkwọ dị iche iche dịka Ọkammụta na nka, Ọkammụta n’asụsụ bekee, Ọkammụta n’ asụsụ dị iche iche dgz.
Asụsụ Igbo dịka otu n’ ime ihe ọmụmụ ndị m mụrụ n’ụlọakwụkwọ primari n’Akwuazi Secondary School, bụ ihe m nwekarịsịrị mmasị na ya. Ya mere m jiri kpebie ịbụ Ọkammụta asụsụ Igbo n’ọdịnihu ebe ọ bụ na agadị nwaanyị anaghị aka nka n’egwu ọ maara agba. Achọrọ m ịbụ Ọkammụta asụsụ Igbo iji nye aka n’ikwalite asụsụ na omenaala ndị Igbo. Dịka anyị siri mara, asụsụ Igbo abụrụla ihe dara ada. Ụmụ Igbo ahọrọla ịsụ bekee dịka asụsụ ha; bịa n’ala asụsụ ha nwere dịka ndi Igbo n’iyi. Ndị Igbo tụrụ ilu sị na onye jọrọ njọ na-eme ngala ọ dịka ọ na-esi ọnwụ. Omenaala Igbo dịka iti mmọnwụ, ịbọ ụzọ, iri ji ọhụrụ na egwu ọdịnaala Igbo abụrụla ihe e chefuru echefu. Ọ ga-amasị m inye aka n’ikwalite ha. Echere m na mụ onwem isonye dịka otu n’ ime ndị Ọkammụta e nwere n’ asụsụ Igbo ga-enye aka ma wetakwụazi mgbanwe na ndụ ndị Igbo.
Ihe ọzọ m chọrọ inweta dịka Ọkammụta n’asụsụ Igbo bụ inye aka n’ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ ndị Igbo n’obodo a bụ Naijiria. A bịa n’ọkwa gọọmenti, a na-eleda ndị Igbo anya. N’ime mmadụ iri a ga-ahọrọ n’ọkwa ọchịchị, naanị otu onye ga-esi n’agbụrụ ndị Igbo. Ihe dị otu a jọgburu udele ma sigbuo nkapị, ka anyị matakwa na a naghị ahapụ isiaka agba ụrịọ.
Ọzọkwa, n’ihe niile mmadụ nwere ike ịbụ, naanị ọrụ nkụzi bụ ihe ka enye mmadụ ohere, ọkachasị ụmụnwaanyi. Ọ ga-amasi m ịgbaziri ndị na-eto eto ụzọ maka ọdịnịhu banyere omenala n’asụsụ Igbo, n’ihina ọkụkọ hapọ kwọm, o nweghi ihe ọzọ ọ ga-eji zụ ụmụ.
Ọ bụrụkwụazi na Chineke gozie mbọ niile m na-agba, ọ ga-abụrụ m nnukwu ihe oṅu imepe nnukwu ọba akwụkwọ Igbo (Igbo Library), n’obodo a bụ Naijiria. Ọba akwụkwọ a ga-abụ ebe a ga na-eme asompi n’etiti ndị ntorobia ala anyị. Ama m na ọ ga-enyekwụazi aka ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ n’ ala Igbo.
N’ikpeazụ, ekpere m bụ ka Chineke nyere m aka imejupụta ihe m chọrọ ịbụ n’ọdịnịhu site na mbọ m na-agba, n’ihi na ọ bụ onye bara ọhịa ka ọhịa na-ezo.

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 0 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.