Sponsored
Search
Navigation

IHE BỤ ASỤSỤ: WHAT LANGUAGE IS -by B. C. Adamaechi

GỊNỊ BỤ ASỤSỤ?

Ọtụtụ ndị mmadụ esila ụzọ dị iche iche kọwaa asụsụ, mana isi sekpụ ntị na nkọwa ndị a niile bụ na asụsụ bụ ụzọ mmadụ na ibe ya na-esi enwe mkparịtaụka n’etiti onwe ha. Mara nke a: Tupu ụda ọbụla etozuo ịbụ asụsụ, ọ ga-enwerịrị nghọta n’ụdị na onye a gwara okwu ga-emegharị ahụ na-enye nzaghachi nye okwu a gwara ya. Ndị ụfọdụ an-asị na asụsụ malitere mgbe ahụ mụọ nsọ dakwasịrị ụmụazụ Jesu nke mere ka ụwa kee n’olu n’olu. Ndị ọzọ na-echekwa na Chukwu kere ụwa, kee mmadụ, bụkwa onye kenyere ya asụsụ dị nnukwu mkpa n’ụwa a dị ka mmiri na ikuku nke na-enyere ndụ mmadụ aka. Onye jiiri nwayọ chee echiche ka ụwa kaara ịdị ma a sị na asụsụ adịghị, ga-achọpụta na ndụ mmadụ, ka o siri gbasata mmetụta ahụ mmadụ na ibe ya, kaara ịhia nnukwu ahụ. Nke a ga-akacha pụta ihe ma anyị mata na ọ bụ n’usoro asụsụ ka mmadụ na ibe ya ji amata ihe ha bu n’uche, mgbe agụụ ihe dị iche iche na-agụ mmadụ. Ụzọ ịkọwapụta ihe ndị a niile kaara ịhịa mmadụ ahụ. Ọ bụ ụdị uru dị etu a mere ọtụtụ mmadụ n’ụwa gbara gburugburu, ji mara na ihe ọmụmụ gbasara asụsụ dị oke mkpa, ụmadị ka nchọpụta sayensị asụsụ sigoro mee ka a mata na asụsụ bụ otu ụzọ mmadụ siri dị iche n’anụmanụ ndị ọzọ Chineke kere. Sayensị asụsụ lingwistiiki mere ka anyị mata na mmadụ bụ nnanị ihe na-eku ume a maara taa dịka nke naani ya nyere asụsụ. ihe anụ ndị ọzọ nwere bụ ụzọ nzirite ozi, ha enweghị asụsụ. Asụsụ bụ ụzọ obibi ndụ. Ọ bụ otu n’ime akụkụ anyị. E wepụ asụsụ, a gaghị amakwa onye bụ onye. Asụsụ bụ ụzọ omenala obodo si abasa site n’aka nne na nna banye n’aka ụmụaka. Etụ a kwa ka asụsụ siri bụrụ ụzọ mmadụ si eme ihe ọbụla na-enye ya agamnihu. Ịgbasa nkụzi nke ọkwụkwe, azụmahịa, ọchịchị na ọtụtụ ihe ndị ọzọ bụ ndị na-eweta agamnihu na mmepe bụ site n’asụsụ ka e si ezipụta ha. Asụsụ niile dị ń uwa a malitere n’ụdị a sụrụ n’ọnụ. Ọ bụ ya kpatara ndị na-amụ asụsụ site n’ụzọ sayensị jiri nye asụsụ a sụrụ n’ọnụ ọkwa dị elu karịa ụdị asụsụ nke e dere ede, tụmadị ka o siri gbasata lingwistiiki ụtọasụsụ ọgbaraọhụhụ. N’asụsụ niile malitere n’ụdị a sụrụ n’ọnụ etosighị ịtụ onye ọbụla ń anya n’ihi na a ka nwere ọtụtụ asụsụ maọbụ olu asụsụ ndị enwebeghị etu e si ede ha. Ide asụsụ ede ka bụ nnọọ ihe a mụtara ọhụrụ, ebe asụsụ a sụrụ n’ọnụ bụ ụzọ asụsụ siri malite. Nwadike, I.U. (2011) kwuru na asụsụ bụ njirimara onye, o du onye ije. O kwuru hooha na onye asụsụ ya furu, na ya onwe ya efuola. Obidiebube, J.I. (2007) were kwuo na e wepụ asụsụ, ụwa anyị bi n’ime ya ga-abụ ihe efu. Ọ bụkwa asụsụ ka e ji enyefe omenala site n’aka fere n’aka. N’ihi ya, asụsụ fuo, omenala efuola kpam kpam. E wepụ asụsụ, mmadụ agaghị na-echekwa echiche n’ihe na ọ bụ asụsụ ka mmadụ ji eche echiche. Ndị ọ bụla nwere usoro ha si elegara ụwa anya, usoro nkwenye ha, usoro ha si akọwa ihe, tinyere ihe ndị ọzọ na-ezipụta ihe ndị ahụ. Asụsụ fuo, ihe ndị ahụ abụrụla akụkọ mgbe ochie. Tupu ndị ọcha ewere asụsụ bekee bịa nala anyị, ndị Igbo bi n’ala ha na-asụkwa asụsụ ha n’Igbo. Mmadụ dịka Hannah Kilham n’afọ 1828 chọpụtara uru ọ bara iji asụsụ e jiri mụọ nwata kụziere ya ihe. N’afọ 1989 ka Fafunwa na ndị otu ya gbara mbọ mee nchọpụta were chọpụta ma goịpụtakwa na ụzọ kachasi mma isi nye mmadụ mmụta maọbụ kụziere ya ihe bụ site n’iji asụsụ mmiriara nne ya were kụziere ya. Mmụta e nwetara n’ụzọ dị etụ a na-edo anya nke ọma. Ndị mba China, Japan, America na ndị ọzọ mepere emepe bụ n’asụsụ a mụnyere ha (asụsụ mmiriara nne ha), ka e ji akụziri ha ihe. Nke a na-eme ka ha na-amụta ihe a na-akụziri ha nke ọma ma nwee ike na-etinye ya n’ọrụ. Mara nke a: nsogbu anyị bụ ndị Igbo nwere bụ na ọ bụ asụsụ obodo ọzọ ka anyị ji akụzi ihe ma were ya an-enye ọzụzụ. Nke a na-eweta ọgbatauhie na ihe mgabwojuanya. Ndị nkụzi ga-amatakwa na a ga-ebu ụzọ gbaa mbọ ghọta asụsụ ahụ tupu e nwee ike ighọta ihe a na-ekwu maka ya. Njirimara Asụsụ (a) Asụsụ bụ ihe mmadụ. Amụmamụ na ihe ndị ọzọ enweghị asụsụ. (b) Asụsụ na-amụba amụba. Nke a na-egosi na e nwere ike isi n’otu obere okwu mụbata nnukwu okwu. Ọmụmaatụ ga: i. ti + e + la = tiala ii. ga + wa +kwa + nụ = gawakwanụ iii. ị + kpọ + ta = ịkpọta (ch) Asụsụ na-esi n’asụsụ ọzọ ebite okwu maọbụ nkọwa ụfọdụ nke o nweghị. Ọmụmaatụ: • akamụ sitere n’asụsụ Awụsa. • osikapa sitere n’asụsụ Awụsa. • ịchafụ sitere n’asụsụ French. • agboro sitere n’asụsụ Yoruba. • ịyawo sitere n’asụsụ Yoruba. • suya sitere n’asụsụ Awụsa. • ịyaji (ụdị akwa) sitere n’asụsụ Yoruba. • agidi sitere n’asụsụ Yoruba. (c) Asụsụ na-abasa abasa site n’otu obodo banye n’obodo ọzọ, tụmadị obodo ndị bidebere onwe ha. (d) Asụsụ dị ndụ n’ihi na ọ na-eto dịka mmadụ. Mgbe a na-enwe nnukwu agamnihu n’ọmụmụ asụsụ ọbụla, ọtụtụ mmadụ na-asụ ya, asụsụ na-esi etu a na-eto. (e) Asụsụ dịka ihe dị ndụ nwere ike ịnwụ anwụ. Mgbe ndị mmadụ anaghị agba mbọ ịmụ maka asụsụ, ndị na-asụ ya na-epe mpe. Ọ gaghị ete aka asụsụ dị etu a esi n’elu ụwa a pụọ

Dosad Blogs

AD EXPERIMENTUM

My friend C.H.Spurgeon once said that ,”the loss of gold is something, the loss of life is everything, but the loss of Christ is such a loss that no man can restore”.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 1 guest online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.