Sponsored
Search
Navigation

AKỤ M NA-ERI NA NKE M JI ALA (I)

AKỤ M NA-ERI
NA
NKE M JI ALA (I)

Okpala Marcellina E.
O.L.A.C. Nnewi.
08064448631

1. IHE ỤWA
Akpaala m ericha ericha.
Igwe ọgụego ka e jizi agụrụ m ego.
Ijeri kwuru ijeri,
E riwe a gwụ agwụ,
A na-ewepu,
Ọ dọrọ ka ọ dọ,
Ọ bụ m.
Ọ nwekwaa aha karịrị akụnaatakasị,
Kpọwa m ya,
Ọ bụ m.

N’ala anyị,
N’obodo dum gbara anyị gburugburu,
Na mba ofesi,
N’Ohu na n’Igbo,
Chọba:
Ụlọ m dị na ha niile.
Kedụ maka ala,
Ndị tọgbọrọ n’efu?
Ha karịrị aja dị n’ala.

Ụgbọelu, ụgbọala, ụgbọndụ,
Nwunye, di, ụmụ, ihe a kụ’akụ
Na ihe e nwe enwe;
Ọ bụladị mma ahụ,
Na ihe dum e chere
Bụ ihe ụtọ nke ụwa a;
Zuru oke n’ụlọm.

Oke mpako na nganga,
Ụra e mighi emi,
Ụra a dịghị n’anya.
Obi erughi ala,
Oke egwu na oke ize ndụ;
Na kpọtụkpọtụkpọtụ
Nke ogbe, ụmụnna, ụlọụka, obodo,
Ma n’elu ma n’ala,
Hapụnụ m aka
N’ihi na unu dum bụcha ihe ụwa a.

Ihe ụwa,
Unu bu arụ.
Kedụ ka unu siri
Bunye m ihe ndị a niile,
Naanị ka unu wee
Nara m nke ka mma?
Ihe nke el’igwe
Bụ nke m ji ala.

2. ONYE NKỤZI
Onye nkụzi,
Onye nzọpụta,
Onye nduzi,
Onye mgbaziri,
Ọrụ Kristi,
Ọrụ ndị amamihe
Ọrụ Onyenweanyị hafere
Anyị dum n’aka.
N’ebe dum m hụtara onwe m,
Ewerela m nkụgọ karịa nkụzi,
Bụ ihe A tụrụ anya n’aka m?

N’ụlọakwụkwọ,
Ohere m nwere
Ọ bụ maka ikpori nto
Asịrị
Azụmahịa
Igbu oge ndị gọọment
Karịa imezu nkwa m
Kwere n’oge owuwe m n’ọrụ?

N’ule,
{ gbachaa m ahx
{ lafere
Weta, weta
Ma ndị nwere aha
Ma ndị enweghị aha
Ụfọdụ, n’ime akpa m…,woom!

E-i-y-a-a-a-!
Gwawa ha, gwawa ha
Ha arụọla ala
Ha ebiela oji.

Ole nd[ ka a na- agwa?
{- ya m - mma m!
Ọ kwarịị MỤ NA GỊ!
Anyị dum bụchasị ndị nkụzi n’ebe ọ bụla anyị nọ.
Bido n’onwe gị,
Ị na- agwa onwe gị eziokwu
Nara ntaramahụhụ
Karịa ịsị asị?
Ka I wee lafere.

N’ezinaụlọ,
Onye ọ bụla bụ onye nkụzi;
Nne, nna na ụmụaka.
Zaa n’isi onwe gị
Ka Ị si eji m arụ ọrụ;
{ bx onye nkụzi
Ka Ị bụ onye nkụgọ?

N’ogbe,
N’ụmụnna,
N’obodo,
N’ogo ọchịchị ime ime obodo, steeti, gọọmenti etiti,
Na nke ndị ụka;
Tụlee ma ọrịa nke gị ọ karịrị nke
Ndị a na- agwa.

Site na mpụ na aghụghọ ndị a,
Arụọla m ụlọ,
Zụọ ụmụ m dum,
Deba aha m “N’ỌNỤ NA- EKWU EKWU”
Sorokwa ibe m riwe n’efere nkxwa
Ma chezọọ nke m ji ala!

3. DIBỊA BEKEE…DỌỌKỤ!

Dọọkụ e--e! E-e-y-i-i!
Nne dọọkụ – e - e! E -e-y-i-i!
Nna dọọkụ – e-e ! E -e-y-i-i!

Ma m kwesiri [za ya;
Ma m ekwesịghị,
Ụzọ m siri bata
Na ebe m siri bata n’ọrụ ọ
Agbasaghị m
Achọghị m ịma.

Ajụkwala m ajụjụ
Tupu Ị ghọọ
Onye anya ọkụ
Ị chọọ, mee ihe m mere
Ka Ị dị ka m dị.

Ndị ọgụ adịgboroja
Ndị ụlọnchekwaozu
Na ndị e buru ozu onye ọzọ,
Ha ga-ebu ọnụ?

Onye ọ bụla m
Gbara ọgwụ oke,
Maọbụ ọgwụ nkịta,
Ya diwe.

Ihe ahụ m chọrọ
Bụ ego, ugwu na nsọpụrụ
A na-ebunye NDỊ DỌKỊNTA,
Ma chefuo nke e ji ala.

4. NWATA AKWỤKWỌ

Agụm akwụkwọ na-ewuzi,
E-e-e, ka anyị jewenụ;
Ma ndị o kwere
Ma ndị o kweghị,
Ụlọ akwụkwọ nara rie.

Ndị o kwere
Abụghị naanị ndị maara akwụkwọ
Maọbụ ndị nne, nna ha nwere ego?
Mba nụ !
Ọ bụ ndị nwere olileanya
Ndị chọrọ ịmụta ihe ha amaghị
Na mbụ maọbụ itinye
N’elu amamihe dị ochie.
Ndị na-amụ anya: ụtụtụ, ehihie na abalị
Iji chọpụta akaraaka ha,
Jiri ya baara onwe ha,
Ezinaụlọ ha na ọha na eze uru.

Maka ndị o kweghị,
Lee anya n’otu nzuzo
Na otu mmebi iwu dum
Ha nọ ya.
Gụọ akwụkwọ …Mba !
Zụọ ahịa … Mba!
Mụọ ọrụ … Huu-sa … i!

Ndị o kweghị!
Ọ dị ha n’obi bụ ndị nkụgọ
Karịa ndị nkụzi.

Ndị ezigbo ndụmọdụ ha
Bụ ndị okenye arụrụala
Ndị agadiekwenka,
Maazị EỤPO
Na oriakụ ya bụ SPECIAL CENTRE.

Nwata akwụkwọ
Tụgharịa uche
Ma chọọ nke Ị ji ala.

5. OKUELU

1ST Adị m na nwoke,
Adịkwa m na nwaanyị,
Dịrịkwa n’ụmụaka;
Ndị anụahụ bidoro na nwata
Tọwa rịrịrịrị.
Leekwa anya na ndị agadị ekwe’nka
Bụ ndị ụra gwụrụla n’anya,
Ị ga-ahụ m.

2ND Ndị m juru n’ebe dị iche iche
N’ụlọ ndị nwe ha,
Dịka ndị orinampio
N’ụlọ nke aka ha.
Dịka ndị ije ha gbagọrọ agbagọ
N’ụlọ oriri na nkwari
Dịka ndị ije ozi ha gbarala n’anwụ
N’ụlọ njem ha dị iche iche
Dịka maazị na oriakụ Arụrụala Zoro Ezo.

3RD Njirimara anyị bara ụba,
Mana okpocheja ha bụ ndị a:
Ịsị asị kara aka
Ekike ruru inyi
Oke ire uto
Oke etemete/anyamanya.
E yi efe a gba ọtọ
Ịsogharị ekike, ego, nwoke, nwaanyị
Na ihe nke ụwa
Dịka ijiji na- eso onye bu ogiri

N’ikpeazụ, Okuelu,
Ngwaahịa m bụ anụahụ m
Ihe oriri nke ahụụhụ na akịka.
Ụlọahịa m bụrụkwa anụahụ m
Ebe obibi nke Mmụọ Nsọ
Ụgbọ m bụ ụgbọ na-aga aga
Mana kedụ maka nke m ji ala?

4TH Ọrụ m bụ ndị a:
Ịrakọsị gị na Chineke
Ịkesa ọrịaa mmekọ aghara aghara,
Ịtinye ọgbaaghara n’ezinaụlọ,
N’ụlọọrụ nakwa n’ebe dum
Udo kwesịrị ịdị.
Ịre ihere ma zụrụ abụmọnụ so ya
Ịnapụ dibụụlọ uche, ego
Na ihe ndị o ji arụ ọrụ
Chineke hanyere ya n’ aka;
Ịnye ndị nne ohere iji onwe ha
Na ada ha tụ mgbere.
Ịnapụ ndị ụkọchukwu ike na amara nke
Ha ji arụ ọrụ okwukwe na nzọpụta
Nke mkpụrụobi.

Ịnye ụmụokorobịa
Na ụmụagbọghọbịa
Ọzụzụ pụrụ iche,
Maka ibi ndụ akwamiko nke
Ga-esi ike nkwụsị n’ọdịniihu ha
Ịtinye nkewa n’etiti ịhụnanya
Kristi na ụmụntakịrị.

6. AMAMIHE

Abụ m ozi ụzọ;
Ọ dịghị onye pụrụ ịhụ m anya
Maọbụ metụ m aka,
Ihe e nwere ike ịhụta
Bụ ọrụ m.

Abụ m mma ihu abụọ;
Mma na njọ
Nke ọ bụla Ị chọrọ
Aga m enye gị ya n’uju
Ihe ọma sitere n’aka m
Na- eduba na ndụ
Mana nke ọjọọ
Na- eduba n’ọnwụ

Amamihe
Abụ m eribe agwụ agwụ;
Ole ọ bụla Ị nwere
Bụ ole gị na Chi gị ketara
Ya bụ, ole isi gị ga-ebunwu

Amamihe
Mụ buo ibu n’ime gị;
Ị bụrụ ọkụ na-ere ere
Mana a chọọ m achọ n’ime ya,
Ị dọrọ ka iyi na arụsị.

Ị jiri m rụọ ọrụ nke ọma;
Na mbụ,
Ahụ ga-acha gị acha
Ihe mgbu ga-adịrịrị
Ịkwa emo na mkparị
Nwere ike ịso ya.
Mana, n’ikpeazụ,
Ihu ga-awa gị ọchị
Mmeri na a]ụrị ga-abụ
Nke gị.

N’ ụlọakwụkwọ
N’ụlọọrụ
N’ebe azụmahịa gị
N’ebe ofufe gị
Nakwa ebe ọ bụla
Ị hụtara onwe gị
Jụọ onwe gị
Ihe Ị ji m eme n’ebe ahụ
Maka nke Ị ji ala.

7. MMADỤ NKỊTA

N’ụwa ụmụanụmanụ,
Ihe e jiri mara nkịta bụ ọsọ,
Ịta ọkpụkpụ,
Ịta arụ
Ịsa ụsa, akpịrị,
Ịche nche
Na ịgbọ ụja.

N’ụwa mmadụ,
Onye ọ bụla e jiri nkịta tụnyere
Ketara oke n’agwa ndị ahụ.
O nwere ike
Bụrụ ha dum
Maọbụ ụfọdụ n’ime ha;
Naanị ka o wee
Ruwere anụahụ ya isi,
Werekwa lafere.

A bịa n’ịta arụ,
Ịsa ụsa,
Ịche nche,
Na ịgbọ ụja,
Ọtụtụ n’ime ndị a
E jirila ikikere ọchịchị ha nwere
Memilaa ndị niile
Nọ n’okpuru ha
Ka ha ghara
Ikwu pịm,
Maọbụ taa cham.

N’ụwa anụmanụ,
Nkịta na-ata ọkpụkpụ doro anya;
Nke aka Chukwu dị na ya
Mana ọtụtụ mmadụ
Aghọọla nkịta na-ata ọkpụkpụ
A nyawara ha n’olu;
N’ụdị ọ bụla Ị siri ghọta ya
Na-esiteghị n’ebumnuche Chineke,
Naanị ka e wee tata n’uju,
Ihe nke ụwa a.

A bịa n’ọsọ,
Nkịta na-achụ ndị ọjọọ,
Ndị a na-enyo omume ha enyo,
Ndị ije ha gbagọrọ agbagọ
Maọbụ ndị agwa ha edoghị anya.
Mana ihe mmadụ nkịta
Na-achụ karịrị akarị.
Ha anaghị achụ nwunye mmadụ,
Ha na-achụ ada ya;
Ma ngwere
Ma oke,
Ha dum bụcha anụ oriri;
Ma ụdara ọma
Ma ụdara ọjọọ,
Ma nke bu ọrịa
Ma nke ahụ dị mma;
Ọ bụladị ndị sitere n’ime onwe ha pụta,
Ọtụtụ na-achụgide ha
Baa n’ime ọnụ ndị mmụọ
N’eleghị anya n’azụ.

Jide ha
Rie,
Pịwaa
Ma rachaa.
Arụ!
Ihe emeghị
Mana ihe na-eme.

Mmadụ nkịta,
Ọ bụ gị nwe anụahụ gị,
Ka ọ bụ anụahụ gị nwe gị?
Jiri nwayọ,
Ma chee echiche nke ọma
Ma chọọ nke Ị ji ala.

8 NDỤ ACHỌRỌ M ỊMA

Abịala m ụwa,
Dịka ndị ọgbọ m siri bịa.
Rie nri,
Nyụọ nsị
Bụ naanị ihe doro m anya.

Ndị ọgbọ m,
Ha na-agba mbọ;
Eje ozi,
Arụ ọrụ,
Azụ ahịa,
Agụ akwụkwọ,
Ka ọ bụ gịnị?
Achọghị m ịma.

Eluigwe na ụwa
Ha na-ekpukọta isi?
Onye nọ n’elu,
Ọ na-adagbu onye
Nọ n’ala ?
Ọ gbasaghị m.

Ụlọ, ọ na-agba ọkụ?
E nwere iwu n’ụdị ọ bụla,
Ka a na-edowe iwu ndị ahụ edowe ?
A na-anwụ anwụ,
Ka a na-efu efu?
Ala, ọ ga-adị mma,
Ka ọ ga-ada ada?
Nke ahụ bụ okwuaka unu;
Naanị ndụ unu na onwe unu,
Ka unu na-enye mmekpa ahụ.

Biko,
Gị bụ onyendu “Achọrọ m ịma”,
Adị‘mma n’ụlọ,
Adị‘mma n’ama.
Ahụọkụ n’ụlọ,
Isiọwụwa n’ama.
Agaaga,
Achaacha.
Ọ nọ, ma owu ya na-ada

Mmadụ nọ,
Ma mmadụ kọ,
Ọ nọ n’ụlọ
Ma ewu amụọ n’ọgbịrị
Chegharịa; ma chigharịa
Ka Ị baara
Ụwa Ị nọ n’ime ya uru
Maka nke Ị ji ala.

9. PỤREEZI DE LỌỌDỤ!: ALEEEELUYA!

Ndị ụka, Pụ-re-ee-zi de Lọdụ !
Ama m ma Ị ga-eti Aleluya
Ka ọ bụ ka anyị dum,
Kwụsị ya n’ebe ahụ?

Ọ bụrụ na a sị
Ka anyị tinye,
Kedụ onye
Maọbụ ihe
Ị bu n’uche oge Ị na-eti ya?

Onye ụkọ, onye ndu na onye isi emume,
Aleluya gị ọ bụ na Chineke
Ka ọ bụ na taịtị Ị na-elegara anya,
Ka ọ bụ n’ego ọba Chukwu,
Ka ọ bụ n’ụmụ orishirishi maọbụ yọrịyọrị,
Juputara n’ụlọnzukọ?

Kedụ n’ebe ụkọ aleluya nke gị hiwere isi?
Ọ bụ n’ihe nke ụwa a
Ka ọ bụ na nke mmụọ?
Zaa ya!

Nwaada bịara ụka, Pụ-re-ee-zi de Lọọdụ!
Ị bịara ịchọ ihu Chineke
Ka Ị bịara ịchọ onyeabụọ?
Ka Ị so “n’ejentị”?
Ndị bịara ịkwada ụlọnzukọ?
O nwere ụkọ Ị bịara ịnapụ nke o ji ala?
Aleluya nke gị,
Ọ bụ n’ihe ndị a?
Zaa ya!

Gị nwaokorobịa, Pụ-re-ee-zi de Lọọdụ!
Olee nke Ị ji maka ya bịa?
Ọ bụ mkpokq,
Ka ọ bụ mkposa?
Nwaagbọghọbịa ahụ
Ị na-etisasị anya,
Ọ bụ nwunye gị?
Zaa ya!

Ndị nna, Pụ-re-ee-zi de Lọọdụ!
Nna Ị bụ,
Ọ bụ nna okwukwe
Ka ọ bụ nke omeke?
Ọ bụrụ na ọchịchị ụka eruteghị gị aka,
Ị mara na “Akara agbasaarala agidi”
Ndị nna omekịịtọrọ,
Ọ bụ ebe a ka Ị chere
Ego a ga-eji
Zụọ ụmụaka ga-esi bịa?

Ndị nne, Pụ-re-ee-zi de Lọọdụ!
Ama m n’ebe aleluya nke unu dabeere
Ọ bụ n’isiri ndị ọzụzụ atụrụ ofe ọma dị ụtọ
Ịji zuru mkpụrụobi ha n’ohi,
Nye onwe gị maọbụ nye ada gị?
Ka ọ bụ iji bụrụ ugegbe nye ndị ụwa
Zaa ya!

Ụmụaka a, ụmụaka a-a, Pụ-re-ee-zi de Lọọdụ!
Tie aleluya,
Ma ọ bụrụ na Ị bụ enyi Jisọs
Dịka akwụkwọ Nsọ siri dee ya;
Mana ọ bụrụ na Ị bụ
“Oke” na-atakasi akpa Jisọs,
Etikwalaa Aleluya,
N’ihi na Ị ga-atakasịrị YA akpa
Ọ ga-eji wụnye ndị nke YA
Mgbe ha ga-ala.

Gị, nwa Chukwu, Pụ-re-ee-si de Lọọdụ!
Ebe ọ bụla Ị nọ,
Tie ALALUYA!
Achọkwaa karịa,
Tinye ya AMEN
Ma ọ bụrụ na Ị lelechaa
Onwe gị akwụkwọ a, lafere n’ule a nke ọma,

Mana, mmụọ gị na-ama jijiji,
Na-ajụ oyi,
Chegharịa, chigharịa ma chọwa,
Nke Ị ji ala.

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 0 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.