Sponsored
Search
Navigation

ECHIMECHI N’ALA IGBO I

MAKA ỌZỌ N’ALA IGBO
Agụlụka Sọpụrụchi; Ọgụamanam Anthony; Ọfụlụchi Ijeọma; Obijiakụ Paschaline; Obiaghachie Chimaije; Ebelenor Chisom; Obiefuna Chidera; Nzeobiefuna Chidera.

Gịnị bụ Ọzọ?
Ọzọ bụ echichi kacha echichi a na-echi n’ala Igbo iji gosi ọkwa onye ahụ nọ n’ogo ya n’obodo ya, nke na-eweta etu ọhanaeze ga-esi na-asọpụrụ ya dịka omenala na iwu siri dị. Ndị ọzọ bụ ndị na-anọkarị igwe obodo nso. Ọ bụ ha na-agbaziri igwe n’ihe ndị ọ maghị. Ndị bụ ndị ọzọ na-enye aka ịhụ na a na-edowe iwu obodo. Ha na-enyekwa aka ịhụ na obodo na-aga n’ihu. Ọ bụ echichi na-egosi na mmadụ abụrụla ọgaranya, ma zuo oke n’ihe e ji nwoke eme. N’ihi ya, ọ bụ naanị ndị tozuru etozu bụ ndị a na-echi ọzọ.

Etu E si Echi Ọzọ
Ichi ọzọ na-ewe ọtụtụ oge n’ihi ọtụtụ ihe a na-eme oge a na-akwadowe maka ya bụ echichi dịka omenala si dị. tupu e chie nwoke ọbụla ọzọ, ọ ga-agakwuru otu onye maọbụ ụfọdụ ndị e chirila ọzọ, ma jụọ ha ihe niile gbasara ya bụ echichi ọ chọrọ ichi. Ọzọ bụ na ọ ga-eru afọ ole iwu obodo kwuru, ma tulee n’onwe ya ihe ọma ndị o merela n’obodo ya. Onye a ga-echi ọzọ ga-abụkwa onye nwere ezigbo aha n’obodo. Tupu e chie mmadụ ọzọ, a ga-akpọrọ onye maọbụ ndị ahụ a ga-echi ọzọ gaa n’arụsị niile dị n’obodo ahụ, ebe a ga-achunyekwara arụsị ndị ahụ aja. A ga-edukwara ha gazuo ahịa obodo ahụ niile, iji gosi ndị mmadụ ndị ahụ. Ihe a na-akpọ omume nke a bụ ịga ahịa ọzọ maọbụ ịpụ ahịa ọzọ. a na-eme nke a iji gosi ndị mmadụ na onye a a ga-echi ọzọ etozuola ma mezuokwa ihe a chọrọ n’aka ndị a ga-echi ọzọ.
Ịchị ọzọ na-abụ nnukwu emume n’ala Igbo. Tupu e chie mmadụ ọzọ, a ga-ajụ ya ọtụtụ ajụjụ metụtara omenala obodo ya na ndị metụtara ọkwa ịbụ ọzọ. N’abalị na-eso ụbọchị a ga-echi mmadụ ọzọ, a na-eri nnukwu oriri na be onye ahụ a ga-echi ọzọ.

Ụbọchị a ga-echi ọzọ n’onwe ya, ndị a ga-echi ọzọ ga-akwado nke ọma, yiri uwe dị mma, dị ebube ga nọdụ ala n’ama ezumezu n’ebe a kwadooro ha na ndị nwunye ha, ndị na-abụ ndị na-anọdewe ha n’akụkụ. A ga-egbu ọtụtụ ehi, ma sie ụdị nri dị iche iche. Ihe oriri na ihe ọṅụṅụ ga-abụ atụrụ tawa n’ebede (n’ama), na na be ndị a ga-echi ọzọ. Kaosiladị, oge a na-ebido eri oriri bụ ma e chichaa ọzọ. Ọ bụ Igwe maọbụ Onowu na-echi ndị mmadụ ọzọ dịka omenala na iwu ndị siri dị.

Ndị na-anọ ebe a na-echi ọzọ gụnyere ndị ọzọ, ndị ọgọ, ndị enyi, ikwunaibe na ndị obodo gbara obodo ndị na-echi ọzọ gburugburu. Oge e chichaala mmadụ ọzọ, ndị mmadụ na-enye ya ọtụtụ onyinye dị iche iche dịka onyinye ehi, ebule, ewu, ọkụkọ, ji na ego dgz.
Tupu e chie mmadụ ọzọ, ọ na-eji aka ya ahọpụta aha ọzọ ọ ga-aza, nke ndị ọzọ ga-atụle mara ka aha ahụ si dị mma na ma o nweela onye ọzọ na-aza ya bụ aha. Oge a ga-echi ọzọ, onye maọbụ ndị a ga-echi ọzọ ga-esekpuru ala ka e chie ha ọzọ. Oge a na-echi mmadụ ọzọ ka a na-akpọ ya aha ọzọ ọ họọrọ na mbụ n’ihu na na ntị ndị mmadụ. Aha onye ọzọ nwere ike ịza gụnyere (Ọzọ) Ọchịrịọzụọ, (Ọzọ) Omenyịlị, (Ọzọ) Nnanyelugo dgz. Ihe ọzọ a na-eme oge o sekpu ala, a na-echi ya ọzọ bụ ikpunye ya okpu ọzọ, nke bụ okpu mmee a na-etunye ugbene ugo, nyekwa ha nkucha e dere aha ọzọ ya n’elu ya, ma yinyekwa ya eriri ọzọ (akịrị ọzọ). Nke a mecha, igwe ga-agọrọ ya ọfọ maka ọkwa ọzọ ọ banyere na ya. Oge e chichala ọzọ, onye e chiri ọzọ na-agba egwu (ọzọ). Ọ na-agbakwa egwu gagharịa n’ọmaahịa dị iche iche e nwere n’obodo iji gosi ndị mmadụ onwe ya.
Ekike onye chiri ọzọ na-adị ugwu na-adị ebube. Uwe ya na-adị ọgọ. Onye ọzọ na-agbakwa akịrị maọbụ eriri ọzọ na mgbada ogwe ụkwụ ya, na-ekpukwa okpu mmee e tunyere ugbene ugo, makana ugo gbuzuo, ọ chakee. Ọ na-ejikwa ọdụ enyi, na nkucha e dere aha ọzọ ya na ya, na-ejidekwa oji n’aka, na anyakwa akpa ọzọ maọbụ “akapa nwaehi” dịka ndị si asụ. Akpa ụfọdụ ndị ọzọ na-enwe obere mgbịrịmgba nke ga na-ekụtụ ma ha bụ ndị ọzọ na-aga, iji were kwalitekwuo ebube ọzọ ha.
Ihe ndị a chọrọ n’aka onye ọzọ.

• Ọ bụ ezie na a ga na-enye onye ọzọ nsọpụrụ n’obodo, mana onye ọzọ aghaghị ikwu eziokwu oge niile ka ihe esila dị, nke pụtara na ọ pụghị ịsị asị etu ọ sọrọ ya ihe dị.
• Onye chiri ọzọ ga-abụ onye dị nsọ
• Onye ọzọ kwesiri ịbụ onye na-enye aka edozi esemokwu.
• Onye ọzọ kwesiri ịbụ onye udo.
• Onye ọzọ na-eso na ndị na-agbaziri Igwe na-achị obodo.

Kaosiladị, n’oge ugbua, ọ dịzi ka ọ bụ onye kpata ego chọọ, e chie ya ọzọ n’agbanyeghi etu omume ya dị. Nke a were na-eweta mmetọ ọkwa echichi ọzọ n’ala Igbo.
Ihe ndị e nwere ike ime onye dara iwu ọzọ
Tupu e chie mmadụ ọzọ, a na-enwe iwu ọzọ, ndị bụkwa iwu ndị a ga-agụrụ ya , ọ nabata tupu e chie ya ọzọ. Nke a mere na ọ bụrụ na onye ọzọ adaa iwu ọzọ, ọ kachasị ma a dọchaa ya aka na ntị maka ịda iwu ndị ahụ ọtụtụ oge, ihe e nwere ike ime bụ:

• A ga-ekpupu ya okpu ọzọ ma nara ya ikike o ji bụrụ ọzọ obodo ahụ. Onye ga-eme nke a bụ Igwe obodo maọbụ Onowu, n’ihi na ọ bụ ya kpunyere ya okpu ọzọ (chiri ya). A na-eme nke a n’ihu ọha etu e si gbakọ oge e chiri ya ọzọ.

• A ga-esi n’obodo chụpụ ya dịka iwu obodo si dị.
• A na-egbukwa ya egbu. Ntaramahụhụ nke a na-adị site n’etu iwu onye ọzọ dara si dị. Ụdị iwu onye ọzọ ga-ada, ga-eme ka a chụpụ ya n’obodo bụ iwu dịka ịdakpo nwunye mmadụ maọbụ ajadụ nwanyị (raping).

Kedu etu otu echichi ndị obodo gị na-echi, kedu etu ha si echi ya? Detara anyị ihe na fada.rich@gmail.com

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 1 guest online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.