Sponsored
Search
Navigation

ONOWU, IGWE AND LỌỌLỌ in Igboland

ONOWU, IGWE AND LỌỌLỌ in Igboland

IGWE (EZE) N’ALA IGBO (Kingship in Igbo land)

Nwadịlịọra Chukwuebuka, Obiefuna Ọbịageli, Okafọ Chinọnyere, Atụịlị Ekene, Ezenwokike Chinaza, Amaduche Adaobi, Onwụsogbulu Chinelo, Ibe Chisom, Ekemezie Ọlụchukwu.

Igwe bụ onye isi obodo, na onye nchekwawa omenaala na ọdịnaala n’obodo nke ya n’ala Igbo. N’ala Igbo, obodo ọbụla na-enwe Igwe na-achị achị na ya. O nwere ike bụrụ na o nweghi otu onye a na-asị na ọ bụ ya bụ Igwe ala Igbo niile, nke mere e ji asị “Igbo enwe Eze”, mana obodo ọ bụla na-enwe Igwe (eze) nke ya. Ọ bụrụ na obodo enweghi eze, ọ na-eme ka obodo ndị ọzọ na-eleda ya anya, ọ kacha ma ọ bụrụ na ihe mere obodo ahụ enweghi eze bụrụ site n’enweghi nkwekọrịta n’onwe ha maka onye ga-abụrụ ha eze. Ọ bụ nke a mere obodo ọbụla ji agba mbọ ka ha gbalahụ ịbụ ihe akaje site n’aka obodo ndị ọzọ n’ala Igbo.

Tupu e chie mmadụ Igwe, o nwere ọtụtụ nnyocha a na-eme onye ahụ. Nnyocha ndị ahụ gụnyere:
• Ma onye ahụ bụkwa ezigbo nwaafọ obodo ahụ. Nke pụtara na onye ahụ aghaghị ịbụ onye obodo ahụ.
• Onye ahụ ga-abụrịrị ọzọ n’obodo ahụ.
• Onye ahụ ga-abụrịrị onye nwere ezigbo aha n’obodo. Ọ gaghị abụ onye zurula ohi n’obodo, onye dakporola nwaanyị mmadụ; onye na-eme nsị; onye na-eri akaazụ maọbụ na-akwado ihe ndị a dgz.
• (N’obodo ụfọdụ n’oge ugbua), onye ahụ aghaghị ịbụ onye gụrụ akwụkwọ.
• Onye ahụ apụghị ịbụ onye na-arụ ọrụ gọọmet.
• Onye ahụ aghaghị iru afọ ole obodo ya kwuru na onye ga-abụ igwe ga-eru.
• Onye ahụ ga-abụ onye nna ya nwụrụla.
• Onye ahụ aghaghị ịbụ onye isi zuru oke.
• Dgz.
N’ezie, e nwere ike nwee ihe ụfọdụ dị iche n’ihe ndị a e depụtara site n’otu obodo ruo n’ọzọ. E nwekwara ike nwee ihe ụfọdụ obodo nwere ike ịgbakwụnye na ndị a, mana ihe a chọrọ n’aka onye ga-abụ igwe aghaghị ịbụ ihe yitere ihe ndị a.

Oge e mechaala nnyocha, a ga-agụrụ onye ahụ ihe bụ nsọ onye ga-abụ Igwe dịka:
• Igwe agaghị aga ebe a na-akwa ozu naanị ya na n’onwe ya.
• Igwe agaghị aga ahịa obodo n’onwe ya.
• Igwe agaghị azọ ọchịchị ọbụla.
• Igwe agaghị eri nri n’ọha.
• Igwe agaghị na-arụ ọrụ ego maọbụ na-azụ ahịa maọbụ na-atụ mgbere (business).
• Dgz.
N’ezie, e nwere ike nwee ihe ụfọdụ dị iche n’ihe ndị a e depụtara site n’otu obodo ruo n’ọzọ. E nwekwara ike nwee ihe ụfọdụ obodo nwere ike ịgbakwụnye na ndị a, mana ihe a chọrọ n’aka onye ga-abụ igwe aghaghị ịbụ ihe yitere ihe ndị a.

Ọ bụrụ na ihe niile agachaa etu e si chee, ụbọchị a ga-echi igwe, mmadụ niile ga-agbakọ n’ụlọ ezumezu obodo ahụ (Town Hall), ebe onye a ga-echi Igwe ga-ebinye aka n’akwụkwọ iji gosi nnabata, ma ọ bụrụ na o kwere n’ihe e kwuru.
Ụbọchị a ga-echi Igwe, a ga-esi ụdị ihe oriri dị iche iche, nute ụdị mmanya dị iche iche. Ụdị egwu dị iche iche ga-agbakwa. Obodo niile ga-agbakọ, tinyere ndị abụghị ndị obodo ahụ e ziri ka ha bịa, (na ndị e zighi). Ọ bụrụ na e mechaa emume ichi igwe, nke ọ bụ Onowu nke Igwe nke nwụrụla anwụ ga-echi onye ahụ, Igwe ahụ e chiri ọhụrụ na ndị niile e chiri echichi nọ ebe ahụ ga-agba egwu ufie.

Tup a gbasaa, igwe gwachaa ọhanaeze okwu, ọ ga-ahọpụta Onowu nke ya, onye nke ga-esi na zone maọbụ ọnụkụ dị iche site na nke Igwe ahụ si. Igwe ga na-agba ọfala ihe dịka afọ atọ ọbụla. Ọfala bụ emume igwe na-eme n’ime afọ olenaole ọbụla n’ime oge ọ bụ igwe, iji me ka ọnọdụ ya dịka igwe na-adị ire ma na-enwekwa ugwu.
Igwe merụọ ala
Ọ bụrụ na Igwe daa iwu, a ga-achụtu ya site n’ịbụ Igwe obodo. Ndị ọ bụ ọrụ ha ikwuputa gwa ọhanaeze iwu Igwe dara bụ ndị Ichie. Ha ga-akpọpụta ya n’ihu ọha, n’obi ezumezu dịka e si me oge e chiri ya igwe, ebe ahụ ka a ga-ekwu ihe o mere; ndị obodo eleba ya anya. Ọ bụrụ na e ji maka ihe ndị ahụ chụtuo ya, ha ga-amalite usoro, nhọpụta na ichi igwe ọzọ dịka iwu obodo si dị.

Ekike Igwe
Igwe na-eyi uwe mwụda a na-akpọ uwe isi agụ maọbụ uwe isi enyi. Igwe na-eyi ákà n’olu ma n’aka. Ọ na-eji mpi enyi, na-ejikwa nza, na alọ.
Ọfọdụ ọrụ Igwe n’obodo gụnyere:
*Ichekwawa omenaala na ọdịnaala obodo.
*Ikpe ikpe n’obodo
* Igwe na-anọchi anya ndị obodo ya na mba.
* Dgz.

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 0 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.