ICHI AMANWỤRỤ
AMANWỤRỤ
ndị dere ya bụ Igwe Chinọnso, Nnebedum Chịdịọgọ, Nzenwakụ Chiamaka, Nwigboji Chukwuka, Nwankwọ Ụzọma, Mụọ Chinenye, Chukwuemeka Chiekezie
(zitere anyị ajụjụ gị site na richploughman@yahoo.com)
N’ala Igbo dịka n’ebe ndị ọzọ dị iche iche n’ụwa, a na-echi echichi dị iche iche. Echichi bụ ihe ọ na-abụ e chichaa mmadụ, e nwee ihe dị iche onye ahụ e chiri echichi na ndị ọzọ. Nke a bụ makana, echichi bụ ihe a na-etolu etolu, ma bụrụkwa ihe na-eme ka mmadụ nwee ugwu ma nwekwa ihe ndị dị iche ya na ndị ọzọ e nwere ike na-elegara anya dịka ogbodu. N’oge gboo ndị echichi bụ ndị a na-elegara anya n’ihe gbasara ọdị mma nke obodo, niihina onye ọbụla chiri echichi na-eso ebu ibu obodo ya n’ubu aka ya. Mana oge ugbua, ọtụtụ oge ọ na-adị ka ndị na-echi echichi ha na-echi ya ka ha were na-egosi ịma aka n’etiti ndị ọ dị ka ọ dị ha. ya mere na ọ na-adịzi ka ichi echichi ọ bụ inweta ikike ime arụ na mmadụ ịkpagbu ndị e chighi echichi na ndị ha ka mma. Ọtụtụ oge ọ na-adị ka ọ bụzi ndị chiri echichi ka a na-arịa, ebe omume ha na-adị ka ọ bụ nke eze onye agwalam.
Echichi kwesiri ịbụ ihe mmadụ ga-atụle nke ọma tupu o chie, ma bụrụkwa ihe ọ bụ onye a ma na agwa ya n’obodo, na ihe ọ bụ naanị onye tozuru etozu n’ime nke ọma kwesiri ịnabata. Ụfọdụ echichi pụrụ iche a maara aha ha a na-echi n’ala Igbo gụnyere Igwe/eze, ọzọ/nze, omenka, Amanwụrụ, ichie, Loolo/Iyom. Ọ dịkwa mkpa ịkọwa ọzọ na o nwere echichi ndị ka ibe ha ada ụda n’ime echichi ndị a niile. N’ezie, o nwere ndị n’ime ha ọ bụ naanị obodo olenaole na-echi ha, nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ hapụ ịma maka ha. Nke a mere a ga-eji kọwa maka echichi amanwụrụ dịka otu n’ime echichi ndị ahụ anaghị ada ụda, na nke ọ bụghị ọtụtụ obodo na-echi.
Amanwụrụ na-ama mmadụ ama tupu e chie ya onye ahụ ọ mara. Ọ bụrụ na amanwụrụ mara mmadụ, o nweghi ihe onye ahụ ọ mara na-eme ga na-agaziri ya nke ọma, naanị ma ọ zara oku ihe ahụ mara ya. Amanwụrụ na-enye onye ọ mara nsogbu. Ụdị nsogbu ọ na-enye bụ ihe dịka ịrọ nrọ ọjọọ, ihe anaghị agara onye ọ mara nke ọma ruo oge onye ahụ chiri ya bụ amanwụrụ. Niihina ọ bụghị ọtụtụ obodo na-echi amanwụrụ, ọ dịghị mfe, ikwusi ike na ọ bụ obodo nke a maọbụ nke ọzọ na-echi ya. Ma e nwere ike ịghọta na ọ bụ n’obodo ụfọdụ n’okpuru ọchịchị Idemili na Njikọka, niime stet Anambra ka a na-echi amanwụrụ. Obodo ụfọdụ a na-echi Amanwụrụ na be ha gụnyere Ọka, Ifiteanị, nakwa obodo ụfọdụ ndị ọzọ gbara ha gburugburu
Amanwụrụ bụ otu n’ime ọtụtụ echichi a na-echi n’ala Igbo. Tupu mmadụ echie amanwụrụ, ndị chiburu amanwụrụ ga-anabata onye maọbụ ndị chọrọ ichi amanwụrụ, gwa ha ihe ndị a chọrọ n’aka ha maka ichi ya bụ echichi. Onye ga-echi amanwụrụ wetachaa ihe ndị a gwara ya weta, ndị ahụ chiburu amanwụrụ, na-eke ihe ndị ahụ n’etiti onwe ha. Ụbọchị a kara ichi ya bụ echichi, a na-aga n’ama ebe a ga-echi ya, nke bụ ebede obodo ahụ. Oge e chichara mmadụ amanwụrụ, a ga-ekpunye ya okpuata maọbụ okpu e ji ọtanị were kpa n’isi. Nke a mechaa, ọ ga-agba egwu n’ọgbọ. O nwere ike si n’ọgbọ gbara egwu gawa ebe ndị ọzọ. Oge onye chiri amanwụrụ ga na-agba egwu, a ga-eji efere ọba na-ekunyere ya nri a sụrụ asụ n’ime ihe nọ ọnọdụ ka akara e jiri chi ya amanwụrụ o bu n’aka, onye ahụ na-ebugharị ya bụ amanwụrụ, a na-akụrụ ya ekwe na egwu ọ na-agba. Onye chiri amanwụrụ gbara egwu na-aga, ndị ogene akụrụ na-eso ya. Ọ gbachaa egwu, o nwekwa ihe ndị ọzọ a chọrọ n’aka onye chiri amanwụrụ, ọ ghaghị imecha ya ruo oge o mezuchara ha. onye chiri amanwụrụ gbara egwu bata be mmadụ, onye ahụ na-ewere ihe o nwere ike were mekwaa ya. Ụfọdụ ihe e nwere ike iji mekwa onye chiri amanwụrụ gụnyere akị bekee, ọka, ube, dgz. Ọ bụ oge ọ gbachara egwu na ma e mechaa ihe ndị ọzọ a ga-eme n’ebede, ka a na-agbasazi. O were bụrụ na mmadụ abụrụla onye chiri amanwụrụ. Ọ dị mkpa ime ka a mata na tupu mmadụ echie ọzọ, n’obodo ndị na-echi amanwụrụ, onye ahụ aghaghị ichigodu amanwụrụ.