Sponsored
Search
Navigation

ARỤ NA ỊKPỤ ARỤ N’ALA IGBO II

ỊKPỤ ARỤ

ndị dere ya bụ Ebeleno Kosisochukwu, Adike Chika, Nwankwọ Chinedu
(zitere anyị ajụjụ gị site na richploughman@yahoo.com)

Ịkpụ arụ bụ emume ọbụla a na-eme oge ọbụla e merụrụ ala, ka obi mmụọ maọbụ ala e merụrụ were dajụọ, ghara ịdịzị ọkụ maọbụ ịdịzi oke ọkụ n’ebe ọbọdọ na onye mere arụ nọ. Ọ bụ site n’ịkpụ arụ ka e ji agbalahụ uke, ọdachị maọbụ ahụhụ obodo maọbụ ndị mere arụ gaara izute.
Ọ bụghị onye ọbụla n’ala Igbo nwere ikike ịkpụ arụ. Ọ bụghịkwa ọnọdụ edemede a ikwu etu e si akpụ arụ ugbua na ebe a. mana otu ihe dị mkpa bụ na ọ bụrụ nnukwu arụ, a na-akpọ ndị eze mmụọ ikike ịkpụ arụ dị n’aka ka ha bịa kpụọ ya bụ arụ, mana ọ bụrụ obere arụ, n’ọtụtụ obodo, ọ bụ eze na-achị obodo ka ọ dịịrị ịkpụ ya bụ arụ. Kaosiladị, ọ dị mkpa ịmata na ọ bụ ndị Agụkwu-Nri na-akpụ arụ. Ndị ọ bụkarị ha na-akpụ ya bụ arụ bụ ndị akakpọ.
E nwere ọtụtụ ihe ndị e ji akpụ arụ dịka ewu, ehi, ebulu, ọkụkọ, ọjị, ji, dgz. Mana ihe ọbụla a ga-eji kpụ arụ na-esi ka arụ e mere si dị. Ọ dịkwa mkpa ime ka a mata na ọ bụ eze mmụọ na-ekwu ihe ndị a chọrọ a ga-eji kpụ arụ ọbụla dịka arụ ọbụla si dị niihi na ụdị ụdị na-adị n’ụdị n’ụdị.
TUPU A KPỤỌ ARỤ
Ihe ndị a bụ ihe ndị dị mkpa a ghaghị ime tupu a kpụọ arụ ka arụ a ga-akpụ were dị ire.
1. Onye maọbụ ndị mere arụ ga-aghọta ma kweta na ha mere arụ
2. Onye maọbụ ndị ahụ mere arụ ga-ekwe nkwa na ha aghaghị eme ya bụ arụ ọzọ
3. Ndị a ga-akpụ arụ be ha ga-akpọ ndị akaebe maka ihe merenu, nkwa ha na arụ a ga-akpụ
4. Onye a ga-akpụrụ arụ ga-eweta ihe afa gwara ya a ga-eji were kpụ arụ o mere
5. Arụ ahụ a ga-akpụ agaghị abụ ihe nzuzo (niihi na arụ anaghị abụ ihe nzuzo ọtụtụ oge)

Ihe ndị a na-atụ anya ya maka arụ a kpụrụ
Ndị Igbo kwere na e nwere ọtụtụ uru na-adị n’ịkpụ arụ ndị gụnyere:
i. Ịkpụ arụ na-eme ka onye kpụrụ arụ dị ọcha
ii. Ịkpụ arụ na-eme ka ahụhụ maọbụ ọdachị gaara ịbịara onye maọbụ ndị ahụ mere arụ kachapụ
Ọghọm ndị Igbo kwere na ha na-esote arụ gụnyere:
i. Ndị obodo ga na-ewe onye ahụ mere arụ ka ajọ mmadụ
ii. A ga na-asọ ya asọ
iii. A na-enwe ihe dịka nzukọ, a gaghị anabata okwu ya
iv. Agbụrụ ọbụla tote ha ga na-ahụ onye ahụ na ndị agbụrụ ya ka ndị ome arụ
v. Onye dị etu ahụ anaghị enwe nsọpụrụ n’obodo
vi. Ndị obodo ndị ọzọ ga-eji maka onye dị etu ahụ na-eleda obodo ya anya

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 1 guest online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.