Sponsored
Search
Navigation

ARỤ NA ỊKPỤ ARỤ N’ALA IGBO I

Ịkpụ Arụ.
ndị dere ya bụ Ebeleno Kosisochukwu, Adike Chika, Nwankwọ Chinedu
(zitere anyị ajụjụ gị site na richploughman@yahoo.com)

Arụ bụ ihe ọbụla otu onye, ụmụnna maọbụ obodo mere karịrị ihe e nwere ike ịkpọ ihe adịghị mma. Ọ pụtara na arụ bụ ihe ọjọọ karịrị ihe ọjọọ ibe ya. Ụdị ihe ndị a na-akpọ arụ bụ ụdị ihe ndị a na-asị na ọ jọkarịrị udele ma sigbuo nkakwụ n’isi. Matthew C. Okoye-Abọsị depụtara ihe ụfọdụ a na-akpọ arụ n’ala Igbo ka ha gụnye:
“Igbu ọchụ
Inye maọbụ idowere mmadụ nsị
Ikechi agamnihu mmadụ
Igbu mmadụ na nzuzo
Iji mmadụ tụ mgbere
Ire akụkụ ahụ mmadụ
Isu ụlọ mmadụ ọkụ maọbụ kụtuo ya
Isu ahịa maọbụ ụlọ ahịa ọkụ
Isu ọba mmadụ ọkụ
Ibo onye aka ya dị ọcha ebubo na o gburu ọchụ
Ibo mmadụ ebubo inye nsị
Izu ego maọbụ ngwongwo ọha obodo n’ohi
Imegbu nwanyị ajadu
Imegbu nwa enwe nne, enwe nna
Iresi maọbụ inye mmadụ ọgwụ maọbụ nrị adịghị mma
Ihopu osisi onye ọzọ kpacha anya kụọrọ onwe ya
Ịkpacha anya gbutuo osisi onye ọzọ
Ikponye ntụ n’osisi onye ọzọ kụrụ
Isunye osisi onye ọzọ ọkụ maọbụ isu ugbo onye ọzọ ọkụ
Isu ugbo onye ọzọ ọkụ
Ịkpacha anya kasịsịa ifulu osisi akụkụ onye ọzọ
Iji gamalini gbuo azụ na mmiri
Ikpuchi arụ
Ịnaghara mmadụ ala ya n’aka ike
Iresi mmadụ anụ nwụrụ anwụ
Ịtọrọ mmadụ
Mmadụ igbu onwe ya
Mmadụ idila anụmanụ
Ịdakpọ nwaanyị
Nwa idina nne ya
Nwa idina nwunye nna ya
Nna idina nwa ya nwaanyị
Nwanne ịlụ nwanne
Nwoke idina nwanne ya nwaanyị, nwadiala, ikwu ya maọbụ ibe ya
Nwa iti nna maọbụ nne ya ihe
Ire ọgwụ adịghị mma
Okenye nwoke na obere nwata nwaanyị inwe mmekọ nwoke na nwaanyị
Ịla ọkụ onye ọzọ n’iyi
Ịta mmadụ amụsụ
Nna idina nwunye nwa ya
Iri anụ mmadụ
Inye maọbụ nara ego iji gbuo mmadụ
Ịtọrọ mmadụ
Ihopu ji a kọrọ n’ala
Ibebisi ome ji maọbụ ihe ubi onye ọzọ
Ike ime
Itinye maọbụ tọgbọrọ mmadụ ihe ga-egbu ya
Nwoke idina nwunye nwanne ya mgbe nwanne ya ka nọ ndụ
Ịnara mmadụ nwunye ya
Ịnara mmadụ di ya
Ịnyụ amịrị n’elu ili ozu mmadụ
Nwanne na nwanne inwe mmekọ nwoke na nwaanyị
Nwoke na nwoke inwe mmekọ dịka nwoke na nwaanyị
Ịhapụ ihe enunu gi ka ha mebie ihe ubi ndị ọzọ
Iri ihe obodo gị na-asọ nsọ
Kedu nke ndị obodo gi ga-etinyekwu na ndị a?”

(Maka omenala na ihe ndị ọzọ metụtara ala Igbo na Ụmụ Igbo gaa na akwụkwọ bụ Nnukwu Ntụziaka maka Ụmụigbo nke onye dere ya bụ Matthew C. Ekoye-Abosi, maọbụ kpọtụrụ anyị).
Ọ dị mkpa ime ka a mata na Igbo kwere na naanị otu na ndị a niile ezuola imetọ ala; ya bụ obodo. Niihi ya, ọ gaghị atụ gị n’anya ịchọpụta na o nwere ka aka gị si dị n’ihe so emerụ obodo anyị oge ugbua.
Naanị mmezi bụ ihe e ji emezi ihe ọbụla mebiri emebi. Mana ọ bụ eziokwu na e kwuru sị na e gbubie zokwụwa, ọ naghị ezuchazi, mana ọ bụ naanị n’ịkpụ arụ ka e si emezi ihe ndị e si n’ime arụ were mebi. Niihi ya, Ụmụ Igbo maara ihe bụ arụ, ma kwere n’ihe bụ arụ, kwenyekwara n’ịkpụ arụ, ya na na ọ bụ site n’ịkpụ arụ ka e si emezi ihe ndị e mebirila etu e nwere ike.

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 1 guest online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.