Sponsored
Search
Navigation

IGBU ICHI N'ALA IGBO

IGBU ICHI
-Ndị Nchọcha bụ: Ededa Sunday, Enemuo Chidimma, Ezubelu Mary Ann C., Enweluani Chinecherem, Ezeobika Chinenye, na Ejim Ekene (Community Secondary School, Agulu)

Igbu ichi bụ nnukwu echichi dịka echichi ọzọ maọbụ amanwụrụ. Onye ọbụla nwere ikike igbu ichi, ma tupu mmadu egbuo ichi, onye ahụ ga-etozurịrị etozu.
Onye ọbụla chọrọ igbu ichi ga-emerịrị emume nye arụsị tupu ọ gawa n’ihu. Nke a bụ maka nkwado mmụọ ala ha nke obodo ahụ kwenyere na ọ bụ chi ha. Mgbe a na-egbu ichi, ndị Igwe, Onowu, Nze na Ọzọ, ma Ichie ga-anọrịrị. N’ala Igbo, o nwere obodo ndị na-egbu ichi dịka Nnanka, Ụmụowere nke dị na Agulu, Agukwu Nri, Ụmụdiọka wdz. Obodo ndị a dịcha na steet Anambra.
Igbu ichi enweghị ihe ọzọ karịa iweta mma maọbụ agụba kawacha mmadụ ihu. Nke a na-abụkarị n’egedege ihu. E nwere ike kawara ya ruo n’akụkụ anya onye ahụ. Mgbe a na-egbu ichi, a ga-enwe onye ga na-atakwasị onye a na-egbu ichi mmiri. Onye ọ bụla ga-egbu ichi ga-anọ n’akwa ọzọ ihe dịka izu asaa. Mgbe nke a gachara, onye ahụ ga-agbanye ọmụ n’ọkpa. Onye gburu ichi nwere ike ị nọ n’akwa ọzọ nwụọ. Onye ụjọ enweghị ike igbu ichi, kama a kaa ya mma maọbụ agụba negedege ihu, o were mezie mmemme dị na ya. Onye ọbụla gburu ichi na-eme nnukwu emume n’ụlọ ya, ma sikwa nri iji kpọkuo ndị mmadụ gwa ha na ya chiri nnukwu echichi. Obi ga-abụ onye ahụ sọ ụtọ. A na-esi ọtụtụ nri dịka osikapa, akpụ, ji mmiri ọkụ wdz. Onye a na-egbu ichi ga-amacha akwụkwọ unere n’ala. Onye ahụ ga-edila aba n’elu akwụkwọ unere ahụ, e wee na-egbu ya ichi. Ụmụ nwanyị enweghị ikikere igbu ichi. Ọ bụ naanị ụmụ nwoke na-egbu ichi. Onye e gburu ichi ga-anọ izu asaa n’akwa ka “ọnya” si n’ichi e gburu ya were kpọọ. Onye ọbụla a ga-egbu ichi ga-ebugodu amanwụrụ. Mgbe ahụ o buru amanwụrụ, ọ ga-apụ ahịa; a ga na-akụkwara onye ahụ egwu.
Gụọ maka amanwụrụ n’ebe ọzọ na websaịtị a.

URU DỊ NIGBU ICHI
1. Igbu ichi na-enye mmadu ugwu na nsọpụrụ
2. Ọ na-egosi onye ukwu.
3. Igbu ichi na-egosi onye bara ụba n’obodo.
4. Ọ na-egosi onye obi kara

ỌGHỌM DỊ N’IGBU ICHI
1. Ọ na-emepụ ọtụtụ ọbara n’ahụ onye ahụ mgbe ọ na-egbu ichi.
2. A na-emefu ọtụtụ ego mgbe a na-egbu ichi.
3. Ogbenye adịghị egbu ichi.
4. Ọ na-emebi ihu.
5. Igbu ichi na-eweta ngala.
6. O nwere ike iwetara mmadu ọnwụ n’ihi ụfụ.

Dosad Blogs

AD EXPERIMENTUM

My friend C.H.Spurgeon once said that ,”the loss of gold is something, the loss of life is everything, but the loss of Christ is such a loss that no man can restore”.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 0 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.