Sponsored
Search
Navigation

NSỌALA N'ALA IGBO

NSỌALA
Ndị Nchọcha bụ: Iloegbunem E. Ebere, Okafor Chibuike, Nwadiliora Ifesinachi, Nwigboji Chukwuka, Umenaba Ifunanya, Igwe Chinonso, Nzenwaku Chiamaka na Mmuo Chinenye; (Community Secondary School, Agulu)

GỊNỊ BỤ NSỌALA?
Nsọala bụ mmadụ ime ihe ala na-asọ nsọ maọbụ ihe obodo na-aso nsọ, ọ kachasị n’ala Igbo. Obodo dị iche iche dị n’ala Igbo nwere ihe ha na-asọ nsọ. Ụfọdụ nwere anụmanụ ha na-asọ nsọ. Ọ bụrụ na o nwee onye riri ya bụ anụmanụ, a ga-ewe onye ahụ ka onye mere arụ. Ọzọkwa, a ga na-ewe onye ahụ ka onye mebiri nsọ obodo ha. Ọ bụrụ nwanyị, ụfọdụ na-asị na o so n’otu ọgbanje.

IHE NDỊ BỤGA NSỌALA
1. Mmadụ igwu ji mmadụ n’ohi
2. Mmadụ ịkpacha anya gbuo ihe enunu (anụ ụlọ) mmadụ.
3. Nwanyị ịrị nkwụ.
4. Nwanyị ịwa ọjị.
5. Izu ihe mmadụ dobere.
6. Nwanyị ịnara nwanyị ọzọ di ya.
7. Nwoke ịkpọrọ nwunye mmadụ.
8. Isu ụlọ mmadụ ọkụ.
9. Idowere mmadụ ọgwụ ebe ọ na-arụ ụlọ maọbụ na nri maọbụ n’ihe ọṅụṅụ.
10. Ịzọrọ ala mmadụ n’ike.
11. Ụmụnne nwoke na nwanyị inwe mmekọ nwoke na nwanyị.
12. Nwanne ịlụ nwanne ya.
13. Nwoke idila nwunye nwanne ya.
14. Nwa idila nne ya.
15. Nwanyị ịnọ be nne na nna ya mụọ nwa (ime mkpuke).
16. Nna idila nwa ya nwanyị.
17. Izu nwa mmadụ n’ohi.
18. Iji mmadụ tụ mgbere.
19. Ịwakpo mmadụ n’ike
20. Ịkutu ụlọ mmadụ rụrụ.
21. Ịkutu ụlọ ahịa
22. Nwoke na nwoke inwe mmekọ maọbụ nwanyị na nwanyị idila onwe ha.

ETU OBODO SI EMESO ONYE MERE NSỌALA OMUME
Obodo ga na-eze onye mere nsoala eze. E nwere ike machie ezinaụlọ onye ahụ iso n’ọtụtụ ihe a na-eme n’obodo. Ụfọdụ ndị mmadụ ga na-achị Ya ọchị, na-eme ya akaje, maọbụ na-akọ ya ọnụ. A ga-eti iwu na tupu a nabata onye ahụ, ọ ga-asa asịsa maka ihe o metara. Ọzọkwa dịka ibe ya, ọ ga-akpụ arụ (ya bụ ịrịọ Chi ukwu, ala, na alụsị) mgbaghara maka ajọ ihe o mere.
Onye mere nsọala ga-anọ ihe dịka afọ asaa maọbụ karịa tupu ọ laghachitekwa n’obodo ya ma ọ bụrụ na obodo mapụrụ ya amapụ. Mgbe ahụ a ga-anabatakwa ya nke ọma dịka onye obodo ahụ.
Obodo na-akpụ arụ n’ala Igbo gụnyere Agulu, Aguleri, Akwaeze, Onicha, Ọka, Enugu-ukwu, Nri na Achịna. Ndị a bụgasị obodo dị na Steet Anambra. A bịa n’Agulu, a na-akpụ arụ site n’ịkpọkọta ndị mere nsọala ahụ ma gwa ha maka ikwe nkwa maka ihe ha mere na ha agaghị emekwa ya ọzọ, ndị mmadụ ewere nwee ike gbaghara ha, ha laba ma ha mechaa etu e si gwa ha…

ỤFỌDỤ URU DỊ NA NSỌALA
1. E si na ya amata etu onye dị maọbụ ihe onye, maọbụ ụfọdụ ndị ezinaụlọ nwere ike ime.
2. Ọ na-eme ka a mata ụdị ezinaụlọ onye mere nsọala siri pụta.
3. A na-esi na ya ama ka obodo si dịta njọ be, ma ọ bụrụ obodo a na-eme nsọala ọtụtụ
4. Ọ na-eme ka egwu dị ndị mmadụ n’ahụ gbasara ime ihe ọjọọ.

ỌGHỌM
1. Ọ na-abụ ihe nwute nyere ndị o metụtara.
2. Ọ na-ewetu ugwu onye maọbụ ndị o metụtara.
3. Ọ na-ewetara obodo nkọcha n’ebe obodo ndị ọzọ dị.
4. Ọ na-ewetakwa ọgbaaghara n’obodo n’ihi ndị kwe, ndị ekweghi maka ntaramahụhụ e kpebiri inye onye mere nsọala.

Dosad Blogs

AD EXPERIMENTUM

My friend C.H.Spurgeon once said that ,”the loss of gold is something, the loss of life is everything, but the loss of Christ is such a loss that no man can restore”.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 1 guest online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.