Sponsored
Search
Navigation

IBEENE N'ALA IGBO

IBEENE
-Ndị Nchọchabụ: Anachusi Emeka, Adike Osita, Anieto Uzochukwu, Aleke Onyinye, Adusi Chioma, Adusi Ozioma, Aniukwu Oluchi na Anaoyine Sunday (Community Secondary School, Agulu)

Arụsị bụ mmụọ na-echedo iwu n’ala Igbo. N’oge gboo, o nweghị ihe mmadụ ga-eme ka ọ ghara ịdị na-ezere arụsị. Ụfọdụ arụsị nwere ụdị omume ndị mmadụ na na-echekwa. N’akụkụ ala Igbo ụfọdụ, arụsị a na-akpọ Ibeene na-ahụ maka ajọ ihe metụtara nwanne na nwanne. Onye tie nne ya maọbụ nna ya ihe o merụọla Ibeene. Nwoke ya na nwanne ya nwanyị, maọbụ onye ya na ya metụbara n’ọbara nwee mmekọ nwoke na nwanyị, ha abụọ emerụọla ibeene. N’ihi ya, onye na-eme ihe mgbe gboo, ọ na-eze. Ọ gaghị echegodu ka e weta akwụkwọ iwu gụọrọ ya. Onye ọbụla a zụchara etu e si azụ onye Igbo ọbụla amarala na iwu na omenala bụ otu, na ya etosighị ime ihe ụfọdụ n’ihi na o mee ha, o emebie iwu na omenala obodo. Ọ gaghịkwa eche na o bụrụ na a hụghị ya, na o nweghi ihe ajọọ ihe ahụ o na-eme ga apụtara ya. Ọ maara na n’ihi na arụsị na-ahu ihe nzuzo, na ọ pụghị apụ zolahụ mmụọ.

Ibeene: Nke a bụ ajọ ihe jọkarịchara ajọ ihe n’ihe gbasara mmekọ nwoke na nwanyị. Ọ bụrụ na nwoke na nwanyị ya na ya metụtara n’ọbara, ya bụ onye ya na ya bụ nwanne emekọọ, a na-akpo nke a “Arụ Ibeene.” Ọ bụ nnukwu ajọ ihe.

Ịkpụ Ibeene: Ihe dị etu a mee, a ga-akpu arụ, tie akwa ọkụkọ n’anya, mee ihe ndị ọzọ dị ya. Ọtụtụ mgbe, a na-akpụ arụ Ibeene, nwoke na nwanyị ahu ga-eburu ebuli gaa obodo ha gburugburu. N’ikpeazụ, ha apụta n’ahịa obodo ha gaa n’okwu arụsị. Ịpụ ahịa ha ga-abụrịrị ụbọchị nnukwu ahịa dịka ahịa Afọ Nnobi, Nkwọ Alọ, Eke Uke, Orie Nneni. Mgbe ha na-apụta n’ahịa, ha abụọ ga-agba ọtọ. O nweghi ihe ha ga-eji kechi ihe nwoke na ihe nwanyị ha. Ọ bụ eze arụsị ga-akpụ arụ Ibeene ahụ.

Ibeene na ịlu nwanyị: Ibeene esika ike n’ala Igbo nke na ndị okenye anaghị ekwe ka mmadu abụọ lụọ di na nwunye ma ọ bụrụ na a chọpụtara na o nwere etu ha si bụrụ nwanne maọbụ metụta. Ọ sọ ya bụrụ na nwanne ahu sitere na mgbe dị anya nke ukwu, maọbụ na o ruola ọtụtụ ndụdụgandụ. Ma ha kwere ekwe ma ha jụrụ ajụ, a ga-asọpụrụ Ibeene. O nwere emume a na-eme ka ndị metụtara site n’oge dị nnukwu anya nwee ike lụọ onwe ha. A na-ajụ ese ruo ebe ha si metụta. Ebe ahu ka a ga-eje mekwaa Ibeene, gbubipu nwanne ha abụọ. A na-akpọ emume a “Igbuwa Ọkwa Ibeene.” Nke a gachaa, ha abụghịkwa nwanne ọzọ. Oge ụfọdụ, ọ bụrụ na nwanne ha bụ dị nso, bịa si n’akụkụ nne ha, a naghị ekwe ka e mee Ibeene. Ihe ọzọ a na-akpọ emume Ibeene nke a na-eme ka mmadụ abụọ wee nwee ike lụọ onwe ha bụ “Ịta Nzu.”

ỌMỤMAATỤ ibeene
Ọ dị ọtụtụ ihe ọjọọ ndị Igbo na-agbarụrụ ihu
1. N’oge gboo, izu ohi ji bu arụ n’ihi na ji bụ nnukwu ihe n’ala Igbo.
2. Ịkpacha anya bechasịa ihe a kụrụ akụ.
3. Onye tie nne ya maọbụ nna ya ihe, ọ bụ arụ nke ndị Igbo kpọrọ Ibeene ka o mere.
4. Nwanyị nọ be di wee nwee enyi nwoke, ọ bụ arụ kwọ nwa n’azụ ka o mere.
5. Ọ bụ arụ mmadụ ịga n’ubi wee bọpụta ihe a kọrọ n’ala.
6. Onye nyụọ nsị maọbụ amịrị n’ebe a na-ekute mmiri a na-aṅụ aṅụ, onye ahụ emeela Ibeene.

ỊKPỤ ARỤ ibeene
Ahụhụ ga-adakwasị mmadụ dịka arụ o mere siri dị ire maọbụ jọ njọ. Ihe nke mbụ bụ ịkpụ arụ. Ịkpu arụ bụ mkpocha na nzacha arụ mmadụ mere. N’ọtụtụ akụkụ ala Igbo, ọ bụ nwa dibịa Nri na-akpụ arụ maọbụ dibịa katara ahụ nke ukwu. Ndị Igbo nwere kwenye na ọ bụrụ na onye mere arụ akpụghị arụ, na ihe ọjọọ ga-adakwasị ya. Mgbe onye ahụ achọghị ịkpu arụ, a na-asị na arụ ga-eso onye ahụ mere ya sotakwo ụmụ ya. Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ ihe ike na-eso onye ahụ dịka: ọnwụ ike, ihe mberede dị iche iche, (dịka ụgbọala igbu onye ahụ, nkwụ ihopu dagbuo onye ahụ, ụkwa ịdagbu onye ahụ, ọkụ ịgba ụlọ onye ahụ), oke ọnwụ n’ezinaụlọ. Ịkpụ arụ na-ewe nnukwu ego. Ihe ndị e ji akpụ arụ gụnyere: (i) ebule, (ii) akwa ọkụkọ, (iii) ọmụ nkwụ dgz.

Onye na-akpụ arụ ahụ ga na-eti ebule n’ala na-asị “arụ pụọ!” arụ pụọ!!” arụ pụọ!!!” Ọ ga-ewere akwa ọkụkọ tinye ya n’ime ọmụ nkwụ na-emetụ ya n’ala, were garuwe ebe ahụ e mere arụ gburugburu na-asị “arụ pụọ!” Ọ ga-ewere akwa ọkụkọ ahụ hihie gbururgburu n’isi onye ahụ mere arụ sị ka arụ hapụ ya aka.

Ntaramaahụhụ sitere n’aka Chineke
N’oge ochie, na “Deutronomy” (28:15- ), a ga-ahụ ahụhụ Chineke gwara ụmụ Izrel na ha ga-ata ma ọ bụrụ na ha ejehie. Ahụhụ ndị ahụ gụnyere:
1. Nkọcha ga-abịakwasị onye mehiere.
2. Ọnụ a na-abụ onye ahụ ga-abụ ka n’obodo ya ka na n’ọha.
3. Onye a na-abụ ọnụ ka onye ahụ ga-abụ na mbata ya nakwa ọpụpụ ya.
4. Eluigwe nke dị n’elu isi ya ga-abụkwa ala, ala nke dị n’okpuru ya ga-abụkwa igwe.
5. Onye ahụ ga-aghọkwara alaeze nke ụwa ihe ntụgharị.
6. Onye ahụ ga-amụ ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị abụ nke ya.

Dosad Blogs

AD EXPERIMENTUM

My friend C.H.Spurgeon once said that ,”the loss of gold is something, the loss of life is everything, but the loss of Christ is such a loss that no man can restore”.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 2 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.