Sponsored
Search
Navigation

ỊGBA AFA N'ALA IGBO

ỊGBA AFA
-Ndị Nchọcha bụ: Orji Favour O., Okoye Ukamaka, Ofuluchi Emeka, Okeke Mmesoma, Okafor Joy, Onuzulike Miracle, na Okonkwo Chinaza (Community Secondary School, Agulu)

Ịgba afa so n’otu n’ime omenala ndị Igbo kwenyere na ya. Ndị Igbo kwenyere na ịgba afa dị mma, iji chọpụta ihe ụfọdụ mere ha, maọbụ ọdachị dịịrị ha maọbụ nke ka na-eme ha.
Ndị ọrụ ịgba afa dịịrị bụ ndị dibịa afa. Ha na-agba afa site n’ịjụta ndị mmụọ maọbụ ndị nna nna ha ihe kpatara onye, ndị, maọbụ obodo ji nọrọ n’ụdị ọnọdụ ha nọ n’ime ya.
Otu ihe ịrịba ama a ga-amakwa bụ na ọ bụ ihe adịghị etu o kwesịrị ịdị, na-ebute ịga gba afa, makana “onye ya na chi ya dị na mma ọ gaje be dibịa achọ onye?” Mkpa dibịa anaghị akpa onye ahụ di ike dịka ndị gboo na-ekwu n’okwu. Igbo kwenyere na ndị dibịa afa na-achọpụta ihe zoro ezo, ebe ọ bụ na ha bụ anya na-ahụ mụọ. o nwere ọtụtụ nsogbu maọbụ ọdachi na-akpata ndị Igbo ji aga-agba afa, ka e were mara ihe kpatara ihe ndị ahụ.

IHE NA-EWETA ỊGBA AFA
Ihe ndị na-eweta ịga gba afa gụnyere:
1. Ọnwụ ike
2. Mmadu abaghị uru.
3. Ezinaụlọ anaghị aga n’ihu; o nweghi onye nwere ihe ọ na-emetụ aka na-aga nke ọma.
4. Oke ọnwụ ịdị n’obodo.
5. Atụghị ime atụ maọlị.
6. A tụọ ma a mụghị
7. Aṅụ ịgbachi ụzọ maọbụ ezinaụlọ mmadụ.
8. A na-agba afa ịgụ oge a mụrụ nwa ọhụrụ iji mata onye lọọrọ ya ụwa.
9. Mmadụ na-arịa oke ọrịa, a ga-agba afa ịma ihe kpatara ya.
10. Di na-abịara nwanyị, a ga-agba afa ka a mara ma ọ bụkwa di ya.
11. Nwata a mụrụ ọhụrụ ịrịa oke ọrịa.
12. Mmadụ ịnọkata pụọ ara ọcha wdg.

IHE NDỊ DIBỊA JI AGBA AFA
1. Ọmụ nkwụ.
2. Azịza
3. Mmanya ọcha.
4. Ugbene ọkụkọ.
5. Uriom ọkụkọ.
6. Nzu.
7. Ọjị.
8. Ego ayọrọ.
9. Ekpiri.
10. Afụ na kọbọ.
11. Ogene ọ ga na-akụ.
12. Mbe, wdg.

URU ỊGBA AFA BARA
1. Ọ na-eme ka mmadụ mara ihe dịịrị ya n’ọdịniihu.
2. Dibịa na-agba afa na-enyere ndị mmadụ aka ime ihe ha kwesịrị ime na oge ha kwesịrị ime ya.
3. Ndị obodo na-esi na dibịa na-agba afa amata mgbe ihe mberede nwere ike ịdakwasị obodo, were chọwa ụzọ ha ga-esi gbochi ya dịka:
a. ụganị ịdakwasị obodo.
b. Obodo ọzọ ịwakpo ha agha dgz.
4. Dibịa na-agba afa na-enyere ndị mmadụ aka ime ihe ha kwesịrị ime na oge ha kwesịrị ime ya.
5. E nwere ike isi n’aka ndị dibịa na-agba afa nweta ntụziaka ime ihe ụfọdụ.
6. Ịgba afa na-enye mmadụ maọbụ obodo obi isi ike.
7. Dibịa na-agba afa nwere ike inyekwa mmadụ ndụmọdụ.
8. E nwere ike isi n’ịgba afa mara ihe na-eme n’obodo ọzọ.
9. E nwere ike isi n’ịgba afa mara ihe mmadụ bu n’uche.
10. Dibịa na-agba afa nwere ike ịhụ ihe kpatara mmadụ jiri nwe nsogbu.

ỌGHỌM
1. Afa na-agharịpụ mmadụ oge ụfọdụ.
2. Ụfọdụ ndị dibịa na-agba afa ji ya akpa ego.
3. Ụfọdụ abụghị ezigbo dibịa afa.
4. Ụfọdụ na-agba afa ụgha.
5. Dibịa na-agba afa anaghị agwọ ọrịa.
6. A na-emefu ego n’ịgba afa.

Ịgba afa n’ala Igbo bara nnukwu uru. Ọ bụ ụzọ e si eme ka obi mmadụ dajụọ site n’ịmata ebe nsogbu siri malite, na ụzọ a ga-esi chụọ nsogbu ahụ ọsọ ụkwụ eru ala.
N’ala Igbo a na-agba afa n’obodo dị iche iche. Dibịa bekee emelighị ka ịgba afa nwụọ.

Dosad Blogs

APRASA 2016 Football Competition Set to Kick Off - DOSAD Commends APRASA for the Initiative

Agulu Priests, Religious, Aspirants and Seminarians Association (APRASA) is organizing a football competition for the youths of catholic parishes in Agulu, Anaocha Local Government Area of Anambra State. It will last from 6th to 13th August 2016.

The letter made available to Fides has it that the venue for all the matches will be in St. Mary’s field at Nwagu Agulu and it is expected that each player has to be a registered member of the parish youth, mercenaries are not allowed. Again, the list of the players must be signed by the Parish Priest or the Parish Youth Chaplain.

Priests Brotherhood Sports and Recreation Club – Achieving Healthy Lifestyle

Tuesday evenings are special at St Anthony Catholic Church Enugwu-ukwu and environs. As from half hour of three in the afternoon, there is a traffic build up. You can see them – young and old, tall and short, fat and thin, huge and pint, all alighting from their cars and lacing their boot and wears, heading to the football field and volleyball court. Among them are lawyers, lecturers, coaches, administrators, musicians, engineers, architects, name them. They are however bonded by two significant binding factors-Catholic Priesthood and Sports.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 1 guest online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.