Sponsored
Search
Navigation

Igbo Traditions/Articles

 
 
MMEMME NNATA NA MMECHI AFỌ ANAMBRA NKE BỤ OZI FADA RICH. N. EKEGBO ZIRI NDI MINISTRY OF INFORMATION AND CULTURE STEETI ANAMBRA N’ỤBỌCHỊ MMECHI AFỌ HA NKE 2012, N’EKWUEME PARK, AWKA, KA ỌNWA DISEMBA, EKE, DỊ N’IRI NA ITOOLU.
Mmemme mmechi Afọ steeti Anambra. Ihe aghaghị ịdi mkpa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya maka ịdịkọ n’otu nke ụmụ Anambra.
Okwu Mmalite

O nweere ike ihe a adị iche n’usoro nke ndị bekee, nke mere ka ndi okenye na-anọ ala were enye ndụmọọdu. Ebe ọ buna ọnọdụ onye ga-ezi ozi a bu nke onye okenye, o kwesiri ịnọ ala ka okwu ya ya were baa nti nke ọma.
N’ala Igbo, Igbo sị na onye nna ya lara mmụọ kenyere ala ubi, nkwụ na ụkwa, o mechaa agụrụ gbuo ya, onye ahụ dara akaraogori, okwu a dị mkpa makana ihe niile gaara ịgbalahụcha ndị Igbo ma ọ bụrụ na ụmụ igbo enweghi nghọta miri emi di n’ime igwebuike, ezi echiche (e ji eso ihe), onye aghara nwanne ya, na uchu e ji echekawa nghọta miri emi di n’okwu ahụ e kwuru na otu aka anaghị eke ngwugwu. Ụmụ Igbo, otu onye nọrọ naanị ya, odudu atagbuo ya, makana onye sọ ya yị aga n’ụzọ na-asị ewu nnọọ. Ọ bụ ya mere na kwa mgbe kwa mgbe, ụmụ Igbo, ọ kacha ụmụ Anambra, ndị otu n’ime ọtụtụ onyinye ha natara chineke bụ njepu, ji anọko ọnụ maka mmemme dị ga ka ụka nwa, ime nzụkọ otu ga, nnọkọ mmechi afọ, mmepe afọ, ọ bụladị nke idu ụlọ dgz, n’obodo ọbụla ha nọ. Nke a were bụrụ nnukwu ihe mgbakwasi ụkwụ iji zọpụ njem itụle etu nzukọ ezumezu ndi a dị iche iche ga-esi bụrụ ihe e bulitere n’ogo dị elu ka ọ bụrụ ome steeti Anambra. Ọ bụrụ na ndị Bọdụ Tọrisim achọọ, ha ga-emeli ya. Ma kedu etu ọ ga-esi kwe omume?
Ihe mgakwasị ụkwụ
1.1 Ihe ndị e nwere ike iji tụkwasị isi were gbado ụkwụ ma hidokwa n’ukwu etu nwata si ehiodo nne ya aka n’ukwu, bụ ihe yiri ihe dị n’okwu mmalite na ụdị ya dị n’akwụkwọ nsọ nke mụ na gị, bụ ebe ọnọzi jụrụ nwazụ Jeso bụ Filip, Gịnị jizi nkịta ọnwụ?
Mgbatị ozi a si etu a dị: ‘mgbe ha na-aga n’ụzọ, ha bịarutere na mmiri, onọzi ahụ asị Filip, ‘lee, ihe a bụ mmiri, gịnị ga-egbochi ime m mmirichukwu? Filip asị ya, ‘ọ bụrụ na I ji obi gị niile kwere na kiristi, e nwere ike ime gị mmirichukwu, “Ọrụ ndị ozi 8:36-37”
Dịka o siri metụta Onozi na onye ozi, ihe a ga-eme abana were sụọ ya nri ga-adị mfe ma a chọọ, ebe ọ bụ na abana dị adị, ndị ga-asụ nri nọ, ite, ikwe na ihe ndị ọzọ dịkwa, ọ baghịzi uru ijụ ma a ga-enwe ike I ji abana sụ nri ma ezi mkpebi dị ya. Ugbua, mmemme mmechi afọ abụrụla ome, ịnata ụlọ adịla ka omenala, ndị chịkọkwara ọgbakọ ụbọchị mmechi afọ a nwere ike bụrụ na ha na-gosipụta nke a n’omume ma ọ bụrụ na Anambra steeti ministrị of ịnfọmashịọn and kọlụchọ na-eji ụdị mmemme a emechi afọ, were malitekwa n’ọnwa Januarị afọ ọzọ. Ọ dị otu a, nke a egosila na ezi mkpebi zuru ezu anaburị etinye n’omume adịla ya, naanị ihe a puziri ime ka e were lapụga onye afọ toro agụ bụ ihe a nwere ike ime, nke ga-amasịkwa akwụkwọ a ma–etinye ha n’ọrụ gụnyere ikọwa ihe olenaole na inye ntụziaka olenaole.
1.1 Ezumezu: Nke a pụtara ogbakọ maọbụ nnọkọ, nke a na-akpọkari nzukọ oge ugbua. Ozutu otu bụ ihe otu onye chepụtara nke na-egosi na ọ bụ site na mmụọ otu onye ka a esi amalite ọtụtụ ihe eji ama atụ na ọtụtụ ihe agamnihu a na–ahụ anya, naani abalị abụọ maọbụ atọ e nyere maka akwụkwọ a e zughị iji lebanyecha anya n’ọtụtụ ọmụmaatu banyere nke a. A na-akọwa na omenaala ndị Isiojii na ncheta ụbọchị ndị isiojii a na-eme na Brazịlụ malitere site n’ịnọkọ ọnụ, ịkọ maka ndụ ha na-ebi n’Afrịka tupu a gbara ha ka ohu laa ala ndị ọcha, bụ ihe malitere oge ndị ohu nke mbu gara ala ahụ na-ezu ike ma ha rụkata ọrụ a na-amanye ha rụọ. E kwuru na ndị ana-ewere ihe ọrụ ha na-akụ egwu, na-agụkwa ụfọdụ egwu ndị ohu n’ala Afrịka. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị isiọma bụ ọbịageli bụ ndị na-abịa oge a malitechara otu, mana a ghaghị ịgụnye ha. Nke a mere o ji di mkpa itụfegere ndị niile abụghị ụsụ ekele n’ihi na ha nọ n’otu ndị ha kwesiri ịnọ ebe ọbụla ha kwesiri ịnọ, ma soro na-eme ihe ha kwesiri ime n’ihi na mmadụ anaghị abụ nwata n’anu o soro gbu.
1.2 Ụlọ Ezumeezu: Ebe ọ bụ na a gụọ ọnwọ, a gụọ ibe ya, ọ dị mkpa ime ka a mata na ụlọ ezumeezu dị mkpa n’oge ugbua. Ụmụ Igbo na-agbsawanye oge ndị televishịọn bụ kpakpando gosiri ka ndị Igbo si agba mbọ, ha kwuwapụtara n’otu n’ime ihe na-echu ha ụra bụ inwe ụlọ ezumeezu ọhụrụ maka ihe niile ha ga na-eme dika ndị Igbo ebe ọ bụ na nke ha na-anọ nay a ugbua atọọla agha Biafụra.
N’oge gboo, ebe ezumeezu nke a na-akpọ Ebede maọbụ obodo na-abụkari n’okpuro ukwuosisi merela okenye na-enye ndo, na-ajụ oyi n’ahụ. N’okpuru ya ka a na-emega ụdị ihe a ndị mmadụ zukọrọ ebe a eme. Ọ bụ n’okpuru ụdị osisi ndị ahụ ka a na-anọ egwu egwu ọnwa, emewe ụfọdu mmemme dịka ịwa ji, ime nzukọ dgz. Ebe ọ bụ na ogbe ọ bụla na-enwe ebede nke ya n’obodo ụfọdụ, onye ọbụla na-eketa uru dị n’ọgbakọ ọbụla e nwere n’ụmụnna, n’agbataobi, n’ ọnụkụ, n’otu ọgbọ dgz, n’ihi na ọ bụ nụdị ebe a na-eke demọkụratiki dividend, pọlitikalu posutu, maọbụ nri refujii o ruo ọtụtụ aka e tu kwesiri ekwesi (ụfọdụ ndị hụrụ agha-Biafụra ga-aghọta ihe a nke ọma). Mana otu ihe mere na isi akwa adịghị ebe a rụnyere ………, n’ihi na ugbu a ụmụ Igbo na-emezi ka akịdị ama okeala, a mazighị ụdị, ihe ụmụ Igbo na-ebe agbụrụ a jizi azụ aga echi.
B. Tupu ihee emee a na-eme ihe maọbụ tupu a na-eme ihe ihe na-eme.
Tupu ihe emee, a na-eme ihe na tupu e mee ihe, ihe na-eme, bụ ọzọ e nwere ike isi kọwa mmemme Nnata na mmechi afọ --------. Nke a pụtara na ihe anaghị anọkata mewe. Mmemme nnata na mmechi Afọ anambra abụrụla ihe a na-eme, ome n’afọ, ma bụrụkwa ihe a maara oge e ji eme ya. Ụkwa ruo oge ya ọ daa. Ọ bụrụ na ilebanye ------ n’ụzọ miri emi n’ihe gbasara isiokwu akwụkwọ a, a gaara ituule nke ka mma, ọ bụ mmemme mmechi afọ Anambra steeti na nnata, nke ga-egosi na steeti mechichaa afọ, onye ọ bụla a ga zuo ike. Kaosiladị, ihe nlebe anya a ga-enwe agaghi akari mmechi afọ na mmemme kwesiri idị n’ime ya.

B. i. mmechi Afọ Anambra.
Ihe ọ bụla nwere mbido na-enwe njedewe. Ebe ọ bụ na-emechi afọ Anambra, ọ pụtara na o nwere oge a malitere afọ amalite etu o sila dị. N’ihi ebe ọ bụ na ụlọ anaghị ada ghara uko, e kwesiri imetụ aka obere n’ihe gbasara mmalite.
E nwere ọtụtụ ihe a na-eme mmalite. ọtụtụ obodo n’ala Igbo na-eme emume Ihejiọkụ, iji gosi na a ga-amalite Iko ji. Ubesie 2010:130 kwuru na “emume nfejọọkụ nke ha n-eme ere na-egosi mmụọ nwe ji ngwo ọrụ ha ji na-akọ ugbo ka ọ gọzie, ka ọgụ ma ọ bụ mma ghara igbu mmadụ n’--------- mgbe ha ga-akowa ihe”.
E wepu emumme Nfejọọkụ maọbụ Nfejiọkụ dika ndị si ekwu, o nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-eme mmalite ndị gụnyere:
Afọ Agụmụakwukwọ, afọ nke ụka, afọ ngalaba ọrụ oyibo dị iche iche, dgz. Otu onye maọbụ otu nwekwara ike nwee etu ha siri kpebie ime mmalite afọ nke ha. Ndị a niile nwere ike mee mmemme mmalite afọ site n’iji naanị ekpere were kpọkuo Olisa. Ụfọdụ nwere ike mee nke ha n’ụdị kama a gaghị agba ncha, sị gbaa n’eku, ebe ụfọdụ nwere ike ime ya n’ụdị akaji akụ, mkana ọ bụ etu aka ha nwanyi ka ọ na-ekonye di ya. O nwekwara ndị ga-asị maọbụ ga-eche ka ihe niile dịwa oge a ga-emechi afọ na ndi ọ naghị agba n’uche ihazi mmalite afọ. Ugbua, ọ ga-adị mkpa ilebanye anya n’ihe gbasara mmechi afọ nke steeti Anambra n’onwe ya na ihe so ya.
Mmechi Afọ nke Steeti Anambra
Onye ọbụla maara na ihe ọbụla a na-eme mmechi bụ ihe ghe oghe, maọbụ ihe nweburu mmalite di ka e sirila kọwaa. Iji gbatiwanye nke a, oxford Advanced leraner’s Dictionary (2001) na-akowa na njedebe bụ “prima part of period of time, an event, an activity or story” (njedebe bụ oge nke a mawaputara maka ihe, mmemme, ihe a na-eme maọbụ akụkọ). Ọ pụtara na ọ bụ n’ime ụdị nkọwa a ka ministry of information and culture banyere were, mmemme ga-adị mkpụrụ ụbọchị atọ were emechi afọ ọrụ nke 2012. Ya gazie!
Ọ dị nnukwu mkpa iji ohere a were too ndị ministrị a maka ezi echiche iji asụsụ Igbo were chịgharịa uche ihe mmechi afọ a nke afọ pụtara, ma dịkwa mkpa na ọ ga-esizi etu a na-adị. Ndị ụlọ ọrụ a werenụ aka ikenga maka nke a, n’ihi na e too nwaanyị agidi ọ gbata ọzọ.
Ajụjụ gbara afụọnụ ka mkpi ndị na-emechi afọ na-ajụ onwe ha n’oge dị etu a gụnyere: kedụ ka uru anyị nwetara n’ime afọ a ha? Uru ọka ọghọ m ka akpụkpụ ọkarịrị nri? Kedu ihe mkpọbi ụkwụ anyị nwetegara n’afọ a? gịnị kpatagara ha, kedụ ka afọ a si dị mma karịa afọ gara aga; ya na kedu ihe a ga-emegasị ka nke na-abịanụ ka o were ka nkea mma? Dgz ebe ọ bụ na o nweghi onye kwesiri ibụ ọkaikpe n’ikpe nke ya, o kwesiri ka ministri si n’ọnụ ndị mmadụ bụ ndị ha na-agbara odibo nụ ma ghọta ihe gbasara ka ministrị na onwe ya siri gba mbọ na steeti a n’ime afọ a a kpụ n’ọnụ, n’ime ọtụtụ afọ ndị garala aga, ndịiche dị n’ihe o meputarala n’ime afọ olenaole n’ime steeti a na etu odịdị ya bụ ministrị si amịta mkpụrụ n’ime steeti a, eweta agamniihu na mmepe n’ime ndị mmadụ na n’ime steeti. Ihe a gba n’aka ejighe enyo ele ya. Ọ bụrụ na azịza ndị a bụrụ n’ụdị omere eme, ministrị na-agba mbọ. Ya gazie!
Ma Ọ bụrụ na akwụkwọ a ga –ewere ọnọdụ ndị Anambra, ọ ghaghị ikwu na ọtụtụ ndị anambra amabeghị maka ministry of information and culture etu ha siri mara maka ọtụtụ otu n’ụka ha na ụfọdụ ngalaba na gọọmentị dịka ANIDS, ASWAMA, ANSEPA ASUBEB, ọbụladị NOA. Ihe nkea pụtara bụ na ministrị a ga-agamikwu agamikwu iji nweta mmetuta ndị mmadụ n’ime ime obodo. Ọ bụghị n’ahịa niile ka a na-aghota ụtụ, ọbụkwaghị ezi niile ka e si echu iyi.
Ihe Igbanugo (2001:2) kwuru maka Afrịka niile, n’ihe o dere ọ gụrụ n’ ọnwa Disemba a, 2012 na Bigard, ka a ga-ekwu ebe a,
“thinking of the ------- African exhibitions onr recalls with nostalgia the rich, educative, informative and entertaining African folklores, music and dances, languages and dialects, arts and artcrafts, religious and social values” (-------------)

Ajụjụ okenye nọ n’ala Igbo nwere ike ịjụ onwe ya bụ “gịnị mere na ministri di etua agaghị abịa ewere asụsụ Igbo, egwu Igbo na njirimara ndị Igbo dị iche iche e nwere were banyechaa n’ogbe niile dị na steeti were nwetazuo ezigbo ihe dị mma dị iche iche dị n’omenala Igbo. Ọ bụrụgodu na a sị na nke a bụ omenala ndị ọ na-agbara odibo ka uwe, nke ahụ ga-adaba nke ọma, ebe ọ bụ na onye chọrọ ijide anụ ga-eme ka anụ ahụ ọ na-ede.

Ministri a inwe ụlọ ọrụ n’ama ezumezu n’obodo ọbụla, o kwe omume n’ogbe ọ bụla n’obodo dị mkpa n’ihi na ime nke a n’ogo naanị okpuruọchịchị (ma ọ bụrụ na e nwere ha) ezughị. E mee nke a, ọ ga-abụ ịgba ndị ka na-eme emume omenala Igbo ume, bụrụ ịjali ndị akpọghị ya ihe, ebe ọ bụ na ihazi asọmpi ga-esorịrị n’ihe ministrị na steeti enwebeghị ihe ha ga-arụ aka, mere na e nwebeghị ike ịrụ ihe dịka ọgba Ọgbụnike (Ọgbunike), Ọgba Ajalli (Ajjali cave), Ezu Agulu (Agulu lake) na ebe ọnatarachi ndị ọzọ dị ka ha, ka ha bụrụ ebe ngosi ihe omenala maka Ọgbọnta vootu sineeti nke ọwụwa anyanwụ Anambra, nke ọdịda Anyanwụ, na nke etiti. Ọ bụ naani onye kwuru na ya nọ ka a na-ama na ọ nọ.
A taa nwata ụta, e kponye ya oke. Ọ pụtaghị na ministrị. A naghị eme ihe ọ bụla, mana ọ pụtara na ihe ọ na-eme fọchara n’ihi na ọ bụladị ndị ngwụrọ na-ahụ ijere oge ọ nọ n’ọgbọ. Nsogbu ministri ekwesighị ịbụ enweghị ego. Nigeria nwere ego. Nigeria nwere ego a ga-eji me ka ndụ duwa na ihe gbasara omenala ndị. Ọ bụladị steeti nwere ike inye aka, makana ọ bụghị arụ ma e si be ajadu nwaanyị rachara aka pụwa. Ebe ọ bụ na onye a na-edu n’ama na-ebu ụzọ, steeti nwere ike ibido ihe ọ ga-emechi maka ọ dị mma nke ndị ọ na-achị.

Nnukwu ihe ministrị a mere aghaghị iji kele ya bụ inye ikike ide ozi a n’asụsụ Igbo. Mana ebe ọ bụ na a na-ekwu maka omenala ndị, ịdị ire ihe niile ga-abị ọ bụrụ na e were asụsụ ndị na-egosi ihe niie a na-ekwu makandi ahụ. Ọ bụ nke a ka a na-akpọ Ọdịbendị (tradition)

Mmechi

ỊKWỌ MMIRI (ỊZA MMIRI maọbụ ỊSA MMIRI)

Otu n’ime ọtụtụ nnukwu ihe ụmụ Igbo na-eme oge ochie, nke ha na-esi na ya enweta agamnihu, ịdịkọ n’otu na ahụike, ma bụrụkwa ihe ha na-ewe ka egwuregwu na-abara obodo ezigbo uru bụ Ịkwọ Mmiri. Ịkwọ Mmiri maọbụ bụ otu n’ime ọtụtụ ụzọ e si edowe obodo ọcha ma na-akwalite ahụike. Tupu ọbịbịa ndị ọcha, nkuzi na mmụta so ya, e nweela ọtụtụ ihe ọma ndị izuzu maọbụ amùma ha dịrịla na ndụ ụmụ Igbo.
N’oge gboo, obodo niile nwere isi ọma inwe mmiriala, mmiri ọgba n’okwute, obere ezu maọbụ ụmị ndị e gwuru maka ọdịmma nke obodo, ndị obodo na-esikwa ụzọ dị iche iche na-echekwaba mmiri ndị ahụ.
Nke a mere o jiri were bụrụ oke na ọrụ dịịrị ndị o metụtara ịga kwọ mmiri ndị ahụ ụbọchị e kwuru e ji eme nke ahụ. N’ọtụtụ obodo, ọ bụ ụmụnwanyị a na-alụ alụ na-aga akwọ mmiri, ebe ọ bụ ụmụ agbọghọbịa na-eme nke a n’obodo olenaole. Kaosiladị, o nwere ike nwee ebe ụfọdụ ọ bụ ụmụ nwoke na-eme ya. Dịka o siri bụrụ ogbe dị iche iche na-emewe otu obodo, etu ahụ ka o siri bụrụ na ụfọdụ ogbe n’obodo na-enwe otu maọbụ mmiri abụọ maọbụ karịa n’ihi etu ala, mgboko, ugwu maọbụ ndagwurugwu ogbe ahụ siri dị. O nwekwara ike nwee ogbe ụfọdụ anaghị enwe mmiri ọnatarachi ndị a, ebe ndị ọzọ na-enwe otu maọbụ karịa n’otu obodo ahụ. Nke a bụ makana mkpụrụaka niile ahaghị. Ọ bụ eziokwu na e kwuola na ọ bụkarị ọrụ ụmụ nwanyị ịkwọ mmiri, ma ọ dị mkpa ime ka a mata na e nwere ụfọdụ obodo ime nke a na-abụ ọrụ Otu Ọgbọ. Nke a mere na ọgbọ dị iche iche ga-eso keta oke ịza maọbụ ịkwọ mmiri. Ma ihe kacha dị mkpa ebe a abụghị ndị na-akwọ mmiri karịa ịkwọ mmiri n’onwe ya.
Ihe e ji aga ịkwọ mmiri na-abụkarị azịza, e kere eke (ya bụ ukwu azịza), nke ka dị n’ahụ igu ya ma ewu tachaa igu (nke ndị akụkụ ụfọdụ na Steeti Anambra na-akpọ akpata), paanụ, obere efere maọbụ ọba, maọbụ iko mmiri, na mmaoge maka igbucha ihe ndị dị mgbucha n’akụkụ mmiri ụbọchị ahụ. N’ọtụtụ obodo n’ala Igbo, a na-akwọ mmiri n’izu n’izu (Ya bụ n’ụbọchị Eke, Orie, Afọ maọbụ Nkwọ),

Ụbọchị e ji akwọ mmiri.
N’ọtụtụ obodo n’ala Igbo, ịkwọ mmiri bụ ome n’izu. Ọ bụ eziokwu na oge ụfọdụ, ndị ọ bụ ọrụ ha ịkwọ mmiri ewere aka ha mara ụbọchị ọ ga-adanyere ha na etu ha ga-esi ga, mana oge ụfọdụ na n’ebe ụfọdụ, onye ekwe maọbụ onye ogene na-eji abalị maọbụ ụzọụtụtụ zisaa ozi maka ya bụ ịkwọ mmiri na ndị ga-akwọ mmiri.

Oge e ji akwọ mmiri
Ọ bụ n’oge ụzọụtụtụ ka e ji akwọkarị mmiri. Ihe kpatara nke a gụnyere: ka ndị kwọrọ mmiri nwee ike imecha ya ma gawa mkpa nke ụbọchị ha. Nke ọzọ bụ ka mmiri were nwee ike ido ọsọọsọ tupu ọtụtụ ndị mmadụ abịawa ichu mmiri ọ kacha ma ọ bụrụ mmiriala. Tupu ndị ga-akwọ mmiri azọbanyewe ụkwụ n’ime mmiri maka ịkwọ ya, ndị chọrọ ikuru mmiri ha ga-eji la n’ime ha, na-ebugodu ụzọ were ihe mmiri ha kuputa nke ha ga-ebu la n’ihi na o nwere ike mmiri agaghị edocha tupu ha lawa. Ọ bụ nke a mechaa ka ha ga-abanyezie n’ime mmiri were bidozie kwọwa mmiri.

Ihe mere e ji akwọ mmiri.
Ihe mere e ji akwọ mmiri bụ ka mmiri were na-adị ọcha. O doro anya na ma azụ, ma akoro, ma mbara, awọ ma ihe ndị ọzọ na-ebi na mmiri na-anọ n’ime mmiri were na-anyụnye ya ihe dị iche iche. Nke a na-eme ka mmiri na-enwe isi, na-enwe mmetọ, ma na-asọkwa oyi. Imi agadi nwanyị, bụ nke ndị oyibo na-akpọ spirogyra, bụkwa ihe na-acha akwụkwọndụ, na-alọ alọ ma a saghị mmiri asa ogologo oge na-ebido adị n’ime mmiri a saghị asa ogologo oge. Oge ụfọdụkwa, mmiri na-esi isi ma ọ dịtee aka a saghị ya asa, ọ kacha ọ bụrụ mmiri ọ natarachi, maọbụ mmiri ndị a ruchighi arụchi dịka ezu na ụfọdụ mmiriala. Ọtụtụ mmiriala na-enwe osisi na iruro na-agba ebe ha dị gburugburu, na-adanye n’ime ha, nke na-eme ka ime mmiri na akụkụ ya hapụ ịdị ọcha. Adịghị ọcha nke mmiri na-ebute ọrịa na-esite na mmiri nke na-eme ka a na-eti iwu ga-enye aka ịhụ na ndị mmadụ anaghị enwe ihe ga-emetọ mmiri.

Ụdị Iwu a na-eti na mmiri a na-echu echu
Site n’etu obodo siri dị, e nwere ụdị iwu dị iche iche a na-eti maka ichekwawa mmiri. Kaosiladị, iwu ndị a anaghị abụ nke onye ọ bụla apụghị ịgụtali, nke o ji abụ nke ga-esiri ndị mmadụ ike idowe. Ụdị iwu a na-etiri ndị mmadụ maka mmiri si etu a dị:

IWU IYI OBIZI!
1. Onye were ajụ akwa chute mmiri a =#20.00
2. Onye zọbata slịpaasị n’ime mmiri=# 20.00
3. Onye sụnye ite mmiri maọbụ peelu ya n’ọnụ mmiri =#20.00
4. Onye bụọ asọ maọbụ kwanye ụkwara n’ime mmiri =#50.00
5. Onye nyụọ amịrị maọbụ nsị n’akụkụ mmiri =#100.00
6. Onye nyụọ amịrị maọbụ nsị n’ime mmiri =# 200.00
7. Onye kuru nwata akarịbeghi afọ anọ chute mmiri #100.00
8. Onye sụọ akwa maọbụ saa ihe ọ bụla n’ọnụ mmiri maọbụ n’akụkụ ya #100.00
9. Onye lụọ ọgụ na mmiri #50.00
MmadỤ nwere ike ichu mmiri oge Ọ bỤla ma Ọ ghaghỊ idowe iwu mmiri niile ndỊ a.
NdỊ binyere aka n’iwu ndỊ a bỤ Ọha Obodo.

Ihe kpatara e ji eti iwu mmiri
N’obodo ụfọdụ, e nwere ndị kwenyere na mmiri bụ nwa Chukwu. E nwekwara ndị kwenyere na mmiri bụ mụọ maọbụ arụsị, nke mere na ọ na-enwe nsọ. N’ezie, o nweela obodo ndị kwere na o nweela mmiri si n’ala obodo ha pụọ n’ihi ihe ndị mmadụ mere ya. N’aka nke ọzọ, o nwekwara ndị kwere na ebe ụfọdụ mmiri nọzi ugbua abụghị ebe ọ nọdu, nke pụtara na o si ebe ọ nọbu were kwapụ n’ihi etu e siri meso ya omume ebe ọ nọbụ. Ime ka nke a dị ka eziokwu, e nwere ọtụtụ ebe a na-enwe ọwa dịka ọwa anụ, ọwa ide maọbụkwanụ ọwa mbuze, bụ ebe ndị mmadụ na-asị na mmiri ndị a na-ekwu maka ha siri gafe oge ọ na-akwapụ.
E wezịga akụkọ ụfọdụ ndị a metụtara ọnụnọ, ọdịdị, ọbịbịa, nkwapụ na ọlịla nke mmiri, iwu mmiri dị ezigbo mkpa maka ịdị ọcha, igbochi ọrịa na udo. Ebe ọ bụ na mmiri bụ nnukwu ihe, ma bụrụkwa onyinye Chineke nyere ndị isiọma, ọ dị mkpa na obodo ọ bụla ga-esi n’ụzọ dị iche iche ha nwere ike were chekwawa mmiri dị be ha Chineke nyere ha.

Dosad Blogs

DOSAD Holds Holiday Camp for U.13, U.15, U.17 and Female Footballers

DOSAD Holds Holiday Camp for U.13, U.15, U.17 and Female Footballers
DOSAD Sports is taking the advantage of the long school vacation to organize football camp and screening exercises for U.13, U.15, U.17 and female footballers this August at DOSAD football Academy Complex Enugwu-ukwu, Anambra State.

First Awka Diocesan Sports: Ekwulobia Region Wins Football, Awka Region, Volleyball

• President Jonathan, David Mark, Egwu, Governors Bag Awka Diocesan Sports Award
• DOSAD Honours Sports Promoters
By Ifeoma Ezenyilimba
The finals of the first edition of the Directorate of Sports Awka Diocese’s (DOSAD’s) sports competition for the priests has ended with the priests of Ekwulobia Catholic Region defeating their counterparts of Awka Catholic Region with a 2-1 win to lift the gold trophy.
This was even as the priests of Awka Catholic Region defeated their Ekwulobia Region to lift the gold trophy for the volleyball.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 0 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.