Sponsored
Search
Navigation

Ịkpọghachi Asụsụ Igbo

by Ezeigbo Chinonso M.

Ọtu onye n’ime ndị ọkachamara dere akwụkwọ a na-akpọ ụtọasụsụ Igbo kwuru sị, “Asụsụ bụ ihe mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta ma bụrụkwa ihe e ji ama ihe onye bu n’uche, ya na ebe onye siri bịa.

     Ọtụtụ ihe arụ dị iche iche na-eme n’ala anyị bụ ala Igbo oge ugbua. Ekwensu etinyela echiche ọjọọ ń ime ndị nne na nna ọgbaraọhụrụ ha wee kewaa asụsụ Igbo, nke na asụsụ Igbo anaghịzi ezu oke ma a na-asụ ya.   O nwezighiị onye ala Igbo ga-ekwu okwu ọbụla ga-achọ ịsụ Igbo agaghị agwakọ ya bekee.  N’oge gboo, asụsụ Igbo bụ ihe e ji ama atụ nyere asụsụ ndị mba ọzọ n’ịtụ ilu.  Ihe dịka ikele ịsaala chi? Ka chi fo, na ndeewo alaala kpamkpam. Egwuọnwa nke bụ ebe a na-anọ amụta omenala ghara isizi na ya were pụọ gụnyere:

ịkparịta ụka n’asụsụ Igbo n’etiti ụmụaka.

ịkwụsi ịgụ ụmụaka aha dịka obodo ndị ọzọ, dịka Shebuge n’asụsụ Bini, Oba n’asụsụ Yoruba were dịrị gawa.

Ịzụlite ụmụaka  n’asụsụ  Igbo n’agbanyeghi ebe a nọ mụọ ha.

Ịkụziri ụmụaka A,B,CH,D,…..bido na ezinaụlọ were ruo n’ụlọakwụkwọ ebe ha ga-agụ.

Ime ka ịgụ asụsụ Igbo bụrụ iwu n’ụlọakwụkwọ niile dị n’ala Igbo. Ọ bụ ihe igba anyammiri na ọtụtụ ndị nwere ọkwa na gọọmentị anaghị asụrụ ndị Igbo ibe ha asụsụ Igbo karịa asụsụ ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ha bịakwụte ha n’ebe ha na-anọ n’ụlọrụ ha. Iji ma atụ, n’Eke Awka, ka ọnwa Juunu dị na mkpụrụ ụbọchi ịrị na atọ, ka otu nwagboghọbịa na-efe ala nna anyị (N.Y.S.C.), bịara n’ụlọbaego a na akpọ, “Oceanic bank” iwere ego, ndị nche ụlọbaego gwara nwagboghọbịa ahụ ka ọ dọsa akpa ya na mpụta tupu ọ banye ụlọbaego, ma nwagboghọbịa ahụ jụrụ, gbaa isi akwara na ya ga-ebu akpa ya we banye n’ime ụlọbaego ahụ. Nke tụrụ m n’anya karịa bụ na mgbe onye nlekọta ụlọbaego nụrụ ihe na-eme, ọ pụtara wee hụ na ọ bụ onye obodo ya ka ya na ndị nche na-eme mkpọtụ. Ọ malitere ijụ ya ajụjụ na ịsụrụ ya asụsụ Yoruba be ha, iji wee mata ihe na-ese okwu.

      Ana m arịọ ndi dị otu a, ji asụsụ Igbo eme ihe ụkaọchi ka ha biko ñomie ndị Awụsa na ndị Yoruba etu ha si eji asụsụ ala be ha akparịta ụka ma ha hụ ibe ha maọbu onye maara asụ asụsụ ha. Echere m na ọtụtụ agwa ụmụaka oge ugbua na-akpa sitere n’aka nne na nna ha wee rute na aka. N’oge gboo, ihe e ji ama ezigbo nwanyị ga-aba na ezinaulo bụ otu nwanyị ahụ sịrị  kpuchie onwe ya nke ọma, ma n’oge ugbua, ndị nne na-eyi akwa anaghị agbada ha agbada, akwa na-egosi ime ahụ ha, chezọọ na Igbo tụrụ na ilụ si “nne ewu na-ata agbara, nwa ya na-ele ya anya”.

     Ana m arịọ ndị ịsịala anyị, Igbo niile, ka ha tie iwu nye ụlọakwụkwọ prịmarị, sekọndịrị na mahadụm niile ka ha na-akụzi asụsụ Igbo, tinyekwa na tupu e were onye Igbo ọbụla n’ọrụ gọọmentị ya na n’ịgụ akwụkwọ na mahadum, na onye ahụ ga egeferịrị n’asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ ebe ọ gụrụ ka a mara na ndị ala Igbo ga-eji asụsụ Igbo wee kpọrọ ihe, makana asụsụ Igbo anwụọla ma agaghịkwa asị ka mkpụrụobi asụsụ Igbo zuru ike na ndokwa maka na e kwuo etu ahụ, ọ pụtara na ọgbọ a ga-amụ n’ihi ihe dịka afọ ise na-abịa n’ihu, a gaghị anụ ihe a na-akpọ Igbo ma ya fọkwazie isụ ya asụ.

     Ọzọkwa bụ ka gọọmentị ala Igbo niile gbakọọ aka wepụta ụlọakwụkwọ Igbo dịka ndị obodo ọzọ siri nwee nke ha. Ọmụmaatụ bụ na e nwere ụlọakwụkwọ asụsụ French, Yoruba, Housa na German wee dịrị gawa itinye asọmpị n'ụlọakwụkwọ ala Igbo dị iche iche gbasara onye ga-asụ asụsụ Igbo ma dekwaa ya ede n’enweghi nkwuhie ọnụ maọbụ ndehie ọbụla.

     Ndi be anyị ọ bụrụ na ọkụkụ hapụ kwom, o were gịnị zụọ ụmụ ya? Ọ bụrụ na anyị bụ ndị Igbo hapụ ọmarịcha asụsụ anyị, kedu ka anyị ga-esị enwe mmekọrịta n’etiti onwe anyị bụ ndị Igbo, ya na ịma onye bụ onye Igbo ebe ọbụla anyị hụrụ onwe anyị? Ogene Ojemba na-ekele Ọkammuta Pita Ejiofor na ndi otu ya bụ ọtụ Subakwa Igbo maka nmalita otu maka asụsụ Igbo.

 

 

Dosad Blogs

DOSAD Holds Holiday Camp for U.13, U.15, U.17 and Female Footballers

DOSAD Holds Holiday Camp for U.13, U.15, U.17 and Female Footballers
DOSAD Sports is taking the advantage of the long school vacation to organize football camp and screening exercises for U.13, U.15, U.17 and female footballers this August at DOSAD football Academy Complex Enugwu-ukwu, Anambra State.

First Awka Diocesan Sports: Ekwulobia Region Wins Football, Awka Region, Volleyball

• President Jonathan, David Mark, Egwu, Governors Bag Awka Diocesan Sports Award
• DOSAD Honours Sports Promoters
By Ifeoma Ezenyilimba
The finals of the first edition of the Directorate of Sports Awka Diocese’s (DOSAD’s) sports competition for the priests has ended with the priests of Ekwulobia Catholic Region defeating their counterparts of Awka Catholic Region with a 2-1 win to lift the gold trophy.
This was even as the priests of Awka Catholic Region defeated their Ekwulobia Region to lift the gold trophy for the volleyball.

ShareThis
Newsletters

Select the newsletter(s) to which you want to subscribe or unsubscribe.

Poll
Which should be the National Language for Nigeria?
HAUSA?
0%
IGBO?
100%
YORUBA?
0%
ANY OTHER?
0%
Total votes: 2
Who's online
There are currently 0 users and 0 guests online.
Syndicate
Syndicate content

Copyright © 2010 Igboniile All right reserved.