Ahịrịokwu na Nkebiahịrị n’Ụdị dị iche iche. -Rich. N. Ekegbo
Mmalite
Tupu a kọwaa nkebi ahịrịndabe, ọ dị mkpa ịkọwa ihe bụ nkebiahịrị. N’aka nke ọzọ, nkebiokwu dị mkpa n’ịkọwa nkebiahịrị. Ebe ahịrịokwu bụ okwu ndị ahụ e doro n’usoro nke nwere ngwaa, bịa gosipụta echiche zuru oke, nkebiahịrị n’aka nke ya bụ usoro, maọbụ ọgbara okwu nke ngwaa adịghị, maọbụ adịbeghi n’ime ya, maka ịkapị ọnụ, echiche e nwere n’ime ya dịka o si adị n’ahịrịokwu.
ỌRỤ SAYENSI ASỤSỤ N’ASỤSỤ -Rich. N. Ekegbo
Mmalite
Tupu e lebanyewe anya na Sayensi Asụsụ n’ebe asụsụ dị, ọ dị mkpa ibu ụzọ leba anya n’ihe bụ asụsụ. N’ịkọwa asụsụ n’aka nke ya, Ngoesi (1989:1) kọwara na, asụsụ bụ iji mkpụrụokwu nwegasịrị nghọta ndị e nwere ike ịsụ asụ, dee ede maọbụ gụọ agụ, mee ka a mata ebumnobi mmadụ.
Ebe sayensi bụ amụmamụ nke na-agbado ụkwụ na nnyochapụta tupu mkpebi, ma na-elekwasịkwa anya n’ihe a na-ahụ anya were aga n’ihe anaghị ahụ anya, Sayensi Asụsụ bụ amụmamụ nke na-agbaso sayensi iji were me nkọwa na mkpebi gbasara asụsụ.
WHICH PARTY WILL PRODUCE ANAMBRA STATE GOVERNOR IN NOVEMBER?
THE RITE OF ỊTỤ NZU BEFORE PRAYING WITH IT
THE ỊTỤ NZU (RITUAL)
Nke a bụ ihe na-egosi udo, a na-eme nke a site n’ịtụrụ ya onye ọbịa n’ihu. Onye ọbịa na-esite n’ala nkịtị tụtụlie ya, were ya kaa akara n’ala, kaa n’mkpụrụ ụkwụ ya ga, kaa n’egedege ihu ya, kaa n’iku anya ya, tee obere n’ọnụ ya ma werekwa nwayọ tụpụrụ ya onye ọ bịara be ya. O nweghi onye na-ekwu okwu oge a na-eme nke a, ma onye ọbịa ma onye ọ bịakwutere. Oge e mechara emume a ka ohere na-adị maka ịsọ ọjị. Ọ bụrụ na onye ọbịa ajụ imetụ nzu ahụ aka, a na-esi n’ụlọ chụpụ ya maọbụ meso ya omume dịka ọ bụ onyeiro nke ji nsogbu bịa.