ONYE E NWE ENWE JI ABALỊ AGỌ ỌFỌ
Oge ụfọdụ ọ dịghị mma mmadụ ime ihe ga-alapụta ya ebe ndị ọ na-agbara obodo nọ. Mana n’ogo nke Nigeria, ndị ọchịchị echeghi na ha nọ n’okpuru ndị ha na-achị. Nke a mere ha ji eme ihe sọrọ ha n’atụghị egwu ndị mmadụ ahụ tinyere ha n’ọkwa ọchịchị. Mana o kwesiri na ọ bụrụgodu na ha na-ezu maọbụ na-emebi ihe ndị mmadụ, ha na-eme ya na nzuzo. Maka na onye e enwe enwe ji abalị agọ ọfọ. Ọzọ, odibo ma ihe kwesiri ịkpachapụ anya n’ebe na oge ọ na-agbara nna ya ukwu maọbụ nne ya ukwu odibo, ka o were nweta ihe dị ya mkpa site n’aka nna ya ukwu maọbụ nne ya ukwu ahụ.
DOSAD Holds Holiday Camp for U.13, U.15, U.17 and Female Footballers
DOSAD Holds Holiday Camp for U.13, U.15, U.17 and Female Footballers
DOSAD Sports is taking the advantage of the long school vacation to organize football camp and screening exercises for U.13, U.15, U.17 and female footballers this August at DOSAD football Academy Complex Enugwu-ukwu, Anambra State.
ARỤ NA ỊKPỤ ARỤ N’ALA IGBO I
Ịkpụ Arụ.
ndị dere ya bụ Ebeleno Kosisochukwu, Adike Chika, Nwankwọ Chinedu
(zitere anyị ajụjụ gị site na richploughman@yahoo.com)
Arụ bụ ihe ọbụla otu onye, ụmụnna maọbụ obodo mere karịrị ihe e nwere ike ịkpọ ihe adịghị mma. Ọ pụtara na arụ bụ ihe ọjọọ karịrị ihe ọjọọ ibe ya. Ụdị ihe ndị a na-akpọ arụ bụ ụdị ihe ndị a na-asị na ọ jọkarịrị udele ma sigbuo nkakwụ n’isi. Matthew C. Okoye-Abọsị depụtara ihe ụfọdụ a na-akpọ arụ n’ala Igbo ka ha gụnye:
“Igbu ọchụ
Inye maọbụ idowere mmadụ nsị
Ikechi agamnihu mmadụ
Igbu mmadụ na nzuzo
Iji mmadụ tụ mgbere
Ire akụkụ ahụ mmadụ
ARỤ NA ỊKPỤ ARỤ N’ALA IGBO II
ỊKPỤ ARỤ
ndị dere ya bụ Ebeleno Kosisochukwu, Adike Chika, Nwankwọ Chinedu
(zitere anyị ajụjụ gị site na richploughman@yahoo.com)
Ịkpụ arụ bụ emume ọbụla a na-eme oge ọbụla e merụrụ ala, ka obi mmụọ maọbụ ala e merụrụ were dajụọ, ghara ịdịzị ọkụ maọbụ ịdịzi oke ọkụ n’ebe ọbọdọ na onye mere arụ nọ. Ọ bụ site n’ịkpụ arụ ka e ji agbalahụ uke, ọdachị maọbụ ahụhụ obodo maọbụ ndị mere arụ gaara izute.
ICHI AMANWỤRỤ
AMANWỤRỤ
ndị dere ya bụ Igwe Chinọnso, Nnebedum Chịdịọgọ, Nzenwakụ Chiamaka, Nwigboji Chukwuka, Nwankwọ Ụzọma, Mụọ Chinenye, Chukwuemeka Chiekezie
(zitere anyị ajụjụ gị site na richploughman@yahoo.com)