ECHIMECHI N’ALA IGBO III
MAKA ỌKWA LỌỌLỌ N’ALA IGBO
Nwankwọ Chiamaka; Tobechukwu Ebube; Obiọra Marbel; Ebelenor Ebube; Okoye Mmesọma; Ọfụlụchi Ụzọma; Ezeh Faith; Ebelenor Kaosisọ; Adịke Chịka.
Lọọlọ bụ otu n’echichi olenaole a na-echi ụmụnwaanyị n’obodo ụfọdụ n’ime Steeti ụfọdụ n’ala Igbo. Ndị a na-echi Lọọlọ bụ ụmụnwaanyị ndị di ha chiri echichi ụfọdụ dịka ọzọ, Igwe, Nze, Onowu maọbụ Ichie. Lọọlọ bụ ya bụ echichi kacha dị elu ụmụnwaanyị na-echi, ma bụrụkwa echichi ndị ọgaranya, ma bụrụkwa echichi e ji egosi na onwe onye chiri ya zuuru ya. Ihe ndị e ji amalite ime mmemme ichi Lọọlọ bụ ihe ndị a ga-enye Igwe na-achị obodo, ndị nze na ọzọ, na ndị Lọọlọ. Ihe ndị ahụ gụnyere ọjị anọ, jaa mmanya ngwọ abụọ, narị mba ji na ego.
Ụbọchị a ga-echi Lọọlọ, a na-ezukọ n’obi igwe ebe a ga-anọ were chi ya bụ echichi. Onye na-echi mmadụ Lọọlọ bụ Lọọlọ nke kacha bụrụ okenye. Oge a ga na-echi Lọọlọ, onye a na-echi Lọọlọ na-agba jigida n’ụkwụ. Ọ ga-eyikwa ákà n’aka maọbụ n’olu. Ọ ga-ekekwa ekike ka nne nwaanyị Igbo zuru ezu, ju eju. Oge a ga-echicha Lọọlọ, onye e chiri Lọọlọ ga-eji nza n’aka, pụta n’ọgbọ gbaa egwu. Ụfọdụ aha pụrụ iche onye e chiri Lọọlọ na-aza gụnyere Osodieme, Ọdịbeze, Ugobeze, Ochinanwata, dgz. E nwere ike ichi Lọọlọ ụbọchị ọbụla dịka ndị siri kwadote.
E chichaa Lọọlọ, onye e chiri Lọọlọ ga-eje n’ahịa, gosi ndị mmadụ onwe ya, ma mee ka ha mata na e chiela ya Lọọlọ. N’ezie, echichi Lọọlọ na-enye nwaanyị ugwu na nsọpụrụ dị iche n’etiti ibe ya, n’ihi na ọ na-eme ka a hụ onye chiri ya ka nwaanyị tozurula etozu n’ala Igbo.
Kedu etu otu echichi ndị obodo gị na-echi, kedu etu ha si echi ya? Detara anyị ihe na fada.rich@gmail.com
Attachment | Size |
---|---|
LỌỌLỌ | 112.17 KB |